JỌN ३:१६ |
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. |
|
1 TESALỌNAIKA ४:१४ |
Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ. |
|
JỌN 11:26 |
Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?” |
|
ROM ६:२३ |
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. |
|
NKPUGHE २१:४ |
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.” |
|
ROM 14:8 |
Ma anyị na-adị ndụ, ma ọ bụ na anyị na-anwụ anwụ, anyị bụ nke Chineke. |
|
LUK 23:43 |
Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, taa, ka ị ga-eso m nọdụ na Paradaịs.” |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |