1 PITA 3:3-4 |
[3] Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla.[4] Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke. |
|
2 KỌRINT 4:16 |
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. |
|
EFESỌS 2:10 |
Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile. |
|
FILIPAI 4:8 |
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya. |
|
ROM 8:6 |
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo. |
|
MATIU 6:28-29 |
[28] “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ Hoge nile maka uwe? Leenụ okoko osisi ọhịa. Ha adịghị echegbu onwe ha maka uwe.[29] Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a. |
|
1 TIMỌTI 2:9-10 |
[9] Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma.[10] *** |
|
GALETIA 3:26-27 |
[26] Nꞌihi na anyị nile abụrụla ụmụ Chineke ugbu a, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs.[27] Anyị nile kwa, ndị e sitere na baptizim e mere anyị, mee ka e jikọta anyị na Kraịst nꞌotu, abụrụla ndị e ji ọdịdị Kraịst kpuchie. |
|
JEMES 1:23 |
Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo. |
|
MATIU 23:28 |
Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |