A A A A A

Ndụ: [Ndị inyom di ha nwụrụ]


JEMES 1:27
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa.

ỌLU OZI 6:1
Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya.

1 TIMỌTI 5:3-16
[3] O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya.[4] Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.[5] Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke.[6] Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.[7] Ihe ndị a bụ ihe i kwesịrị inye ndị chọọchị gị dị ka iwu, ka ụmụ Chineke mụta, ma na-emekwa ihe dị mma.[8] Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.[9] Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile.[10] Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.[11] Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ.[12] Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.[13] Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ.[14] Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.[15] Nꞌihi na ekwensu eduhiela ụfọdụ mee ka ha mehie, ma site na chọọchị gbapụ.[16] Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla.

1 TIMỌTI 5:9
Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile.

1 TIMỌTI 5:3
O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya.

1 TIMỌTI 5:16
Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla.

ỌLU OZI 9:39
Pita sooro mmadụ abụọ ahụ gaa ngwangwa. Mgbe o ruru Jopa, ha duuru ya gaa nꞌụlọ ebe ha nyibere ozu Dọkas. Ụmụ nwanyị nile di ha nwụrụ nọ nꞌebe ahụ na-akwa akwa. Ha gosiri Pita uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.

ỌLU OZI 6:1-6
[1] Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya.[2] Nꞌihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ nzukọ ndị nile kwere ekwe sị ha, “O zighị ezi na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma Chineke bido na-eke nri.[3] Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.[4] Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.”[5] Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.[6] Ha kpọtaara ndị ozi mmadụ asaa ndị a ha họpụtara. Ndị ozi kpeere ha ekpe, bikwasịkwa ha aka nꞌisi.

1 TIMỌTI 5:11-14
[11] Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ.[12] Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.[13] Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ.[14] Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.

1 KỌRINT 7:8-9
[8] Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m.[9] Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị.

LUK 2:37
***

ROM 7:3
O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ.

1 TIMỌTI 5:4
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.

1 TIMỌTI 5:10
Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.

MAK 12:42-43
[42] Ma otu nwanyị batara. Ọ bụ ogbenye, bụrụkwa onye di ya nwụrụ. Ọ tụnyere mkpụrụ ego ọla abụọ ntakịrị nke ruru otu kobo.[43] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a.

1 TIMỌTI 5:5
Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data