A A A A A

Ndụ: [Akụnụba]


1 TIMỌTI 6:17-19
[17] Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile.[18] Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha.[19] Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a.

LUK 19:1-10
[1] Mgbe ahụ Jisọs banyere nꞌime obodo Jeriko mgbe ọ na-agafe.[2] O nwere otu nwoke ọ gụrụ nnọọ agụụ ịhụ Jisọs anya. Aha nwoke a bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi ndị ọnaụtụ, bụrụkwa onye ọgaranya. Kama ọ dị mkpụmkpụ. O nweghị ike ịhụ Jisọs nꞌihi na ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu.[3] ***[4] Ihe Zakịọs mere bụ ịgba ọsọ gaa nꞌihu, nꞌụzọ Jisọs si agafe, rigoro nꞌelu osisi, ka o nwee ike ịhụ Jisọs.[5] Mgbe Jisọs jere ije rute nꞌebe ahụ, o lere anya nꞌelu hụ Zakịọs, gwa ya okwu sị, “Zakịọs, mee ngwangwa si nꞌelu rịdata, nꞌihi na achọrọ m iso gị gaa nꞌụlọ gị taa.”[6] Zakịọs mere ngwangwa rịdata. O jikwa ọṅụ duru Jisọs gaa nꞌụlọ ya.[7] Mgbe ọtụtụ ndị mmadụ ahụ so Jisọs hụrụ ka Jisọs na-eso Zakịọs, ha bidoro ịtamụ ntamụ na-asị, “Lee na nwoke a esorola onye mmehie na-aga nꞌụlọ ya iri ihe.”[8] Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Jisọs okwu sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ana m ekwe nkwa nꞌihu gị, onyenwe m, na aga m ekewa ihe nile m nwere ụzọ abụọ, nye ndị ogbenye otu ụzọ. Ọ bụrụkwa na o nweela ndị ọ bụla m ghọgburu nꞌụzọ ọ bụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”[9] Jisọs gwara Zakịọs okwu sị, “Zakịọs, Chineke abịala nꞌụlọ a taa ịzọpụta gị, nꞌihi na ị bụkwa otu nꞌime ụmụ Eberaham.[10] Nꞌihi na mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị ahụ furu efu.”

MAK 4:19
Ma echiche banyere ihe dị nꞌụwa a, ya na agụụ ịba ụba, na echiche ọjọọ dị iche iche, na-akpagbu okwu ha nụrụ. Ha adịghị amịkwa mkpụrụ.

LUK ۱۸:۱۸-۳۰
[۱۸] Otu onyendu ndị Juu bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na m achọọ iketa alaeze eluigwe?”[۱۹] Ma Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji sị na m bụ ezi mmadụ? Ọ dịghị onye bụ ezi mmadụ. Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye.[۲۰] Ma otu ọ dị banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe iwu na-ekwu. Ọ sị, ‘Akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”[۲۱] Nwoke ahụ zara sị, “Edebezuchaala m iwu ndị a nile siterị na mgbe m bụ nwanta.”[۲۲] Mgbe Jisọs nụrụ ihe nwoke ahụ kwuru, ọ gara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe i kwesịrị ime. Laa nꞌụlọ gị, ree ihe nile i nwere. Kesaa ego i retara nye ndị ogbenye. I mechaa nke a ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe, bịa soro m.”[۲۳] Mgbe nwoke ahụ nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ, obi jọkwara ya njọ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya.[۲۴] Jisọs legidere nwoke ahụ anya mgbe o si nꞌebe ọ nọ na-apụ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike ime, bụ na ndị ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke![۲۵] Ọ dịrị ịnyịnya mfe isite nꞌanya agịga gafee karịa na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke.”[۲۶] Mgbe ndị mmadụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na o si otu a dị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”[۲۷] Ma Jisọs zara ha sị, “Chineke nwere ike ike ihe nile. O nwere ike ime ihe ndị ahụ mmadụ efu na-enweghị ike ime.”[۲۸] Pita kwuru okwu sị, “Onyenwe anyị, leenụ, anyị ahapụla ụlọ anyị soro gị.”[۲۹] Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, o nweghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya ma ọ bụ nwụnye ya ma ọ bụ ụmụnne ya, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ma ọ bụ ụmụ ya, nꞌihi alaeze Chineke,[۳۰] nke na-agaghị anata ihe karịrị ihe ọ hapụrụ nꞌụwa a. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nꞌụwa ga-abịa.”

NKPUGHE 3:17
“Nꞌihi na ị na-asị, ‘Abụ m ọgaranya, nwezuo ihe nile. Mkpa ihe ọ bụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ nꞌihe banyere ndụ ime mmụọ gị. Ị bụ onye e kwesịrị imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.

LUK 16:1-3
[1] Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu odibo na-ejere ya ozi. Emesịa, ndị mmadụ bidoro ịkọsara ọgaranya ahụ na nwa odibo ya na-emebisi ego ya.[2] “Otu ụbọchị, nwoke a kpọrọ odibo ya sị, ‘Gịnị bụ akụkọ ndị a m na-anụ banyere gị? Achọrọ m ka ị bịa guziere m otu i si na-elekọta ego m nꞌihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ odibo m ọzọ.’[3] “Mgbe odibo a nụrụ ihe nna ya ukwu kwuru, o chere nꞌobi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m nꞌọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m jegharịa ịrịọ arịrịọ.

MAK 12:43-44
[43] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a.[44] Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.”

LUK 19:1-27
[1] Mgbe ahụ Jisọs banyere nꞌime obodo Jeriko mgbe ọ na-agafe.[2] O nwere otu nwoke ọ gụrụ nnọọ agụụ ịhụ Jisọs anya. Aha nwoke a bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi ndị ọnaụtụ, bụrụkwa onye ọgaranya. Kama ọ dị mkpụmkpụ. O nweghị ike ịhụ Jisọs nꞌihi na ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu.[3] ***[4] Ihe Zakịọs mere bụ ịgba ọsọ gaa nꞌihu, nꞌụzọ Jisọs si agafe, rigoro nꞌelu osisi, ka o nwee ike ịhụ Jisọs.[5] Mgbe Jisọs jere ije rute nꞌebe ahụ, o lere anya nꞌelu hụ Zakịọs, gwa ya okwu sị, “Zakịọs, mee ngwangwa si nꞌelu rịdata, nꞌihi na achọrọ m iso gị gaa nꞌụlọ gị taa.”[6] Zakịọs mere ngwangwa rịdata. O jikwa ọṅụ duru Jisọs gaa nꞌụlọ ya.[7] Mgbe ọtụtụ ndị mmadụ ahụ so Jisọs hụrụ ka Jisọs na-eso Zakịọs, ha bidoro ịtamụ ntamụ na-asị, “Lee na nwoke a esorola onye mmehie na-aga nꞌụlọ ya iri ihe.”[8] Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Jisọs okwu sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ana m ekwe nkwa nꞌihu gị, onyenwe m, na aga m ekewa ihe nile m nwere ụzọ abụọ, nye ndị ogbenye otu ụzọ. Ọ bụrụkwa na o nweela ndị ọ bụla m ghọgburu nꞌụzọ ọ bụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”[9] Jisọs gwara Zakịọs okwu sị, “Zakịọs, Chineke abịala nꞌụlọ a taa ịzọpụta gị, nꞌihi na ị bụkwa otu nꞌime ụmụ Eberaham.[10] Nꞌihi na mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị ahụ furu efu.”[11] Jisọs nọ nso na Jerusalem mgbe o kwuru okwu a. Nꞌihi okwu a, ndị nụrụ ihe o kwuru chere na ọ gaghị adị anya tupuu alaeze Chineke apụta ìhè.[12] Nꞌihi nke a, Jisọs kọọrọ ha akụkọ a sị ha, “Otu nwoke chọrọ ịga obodo dị anya ebe a ga-eme ya eze.[13] Tupuu ọ pụọ, ọ kpọrọ mmadụ iri na-ejere ya ozi nye ha iri naịra abụọ, iri naịra abụọ, sị ha were ego a zụọ ahịa tutuu ọ lọta.[14] Ma ndị obodo ahụ o si pụọ kpọrọ ya asị. Mgbe ọ hapụrụ obodo ahụ na-apụ, ndị obodo ahụ zipụrụ ndị mmadụ ka ha gaa gwa ya sị, ‘Anyị achọkwaghị ka ị bụrụ eze anyị ọzọ.’[15] “Mgbe nwoke ahụ natachara ike ịbụ eze nꞌobodo ahụ ọ gara, ọ lọghachiri nꞌobodo nke aka ya, kpọọ ndị na-ejere ya ozi o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa guzie ego o nyere ha, ịmata ego ole ha ritere nꞌuru.[16] “Onye nke mbụ bịara sị ya, ‘Onyenwe m, eji m iri naịra abụọ ahụ i nyere m zụọ ahịa, rite uru iri naịra abụọ ụzọ iri.’[17] “Eze ahụ zara sị ya, ‘I mere nke ọma. Site taa gaa nꞌihu, ị ga-achị obodo iri nꞌihi na i jiziri ihe ntakịrị e nyere gị.’[18] “Mgbe ahụ onye nke abụọ bịara sị ya, ‘Onyenwe m, eji m iri naịra abụọ i nyere m zụọ ahịa, rite uru iri naịra abụọ ụzọ ise.’[19] “Eze ahụ zara ya sị, ‘Ị̀ ga-achị obodo ise.’[20] “Onye ọzọ bịakwara sị ya, ‘Onyenwe m, lee iri naịra abụọ i nyere m. Ekechiri m ya nꞌakwa, zoo ya,[21] nꞌihi na atụrụ m egwu. Ị bụ onye afọ tara mmiri bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na onye na-ewe ihe ubi nꞌubi nke ị na-akụghị mkpụrụ.’[22] Eze ahụ zara nwoke a na-ejere ya ozi sị, ‘Ọ bụ okwu si gị nꞌọnụ ka a ga-eji kpee gị ikpe, gị odibo ọjọọ! Ị maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-ewe ihe ubi nꞌubi m na-akụghị mkpụrụ,[23] gịnị mere i wereghị ego m tinye nꞌụlọ akụ ka m nwee ike nwetaghachi ya na ọmụrụ nwa ya mgbe m lọtara?’[24] “Mgbe ahụ eze ahụ gwara ndị guzo nꞌebe ahụ sị, ‘Napụta ya iri naịra abụọ ahụ o ji, werekwa ya nye onye ji ego e nyere ya zụpụta uru ụzọ iri.’[25] “Ndị ahụ zara eze ahụ sị, ‘Onyenwe anyị, nwoke a nwekwaranụ ụzọ iri, ị chọrọ ka e nye ya ọzọ?’[26] “Eze ahụ zara ha sị, ‘Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere.[27] Ugbu a, olee ebe ndị iro m ahụ nọ, ndị ahụ na-achọghị ka m bụrụ eze ha? Kpụpụta ha nꞌebe a gbuo ha nꞌihu m.’ ”

LUK 18:22-23
[22] Mgbe Jisọs nụrụ ihe nwoke ahụ kwuru, ọ gara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe i kwesịrị ime. Laa nꞌụlọ gị, ree ihe nile i nwere. Kesaa ego i retara nye ndị ogbenye. I mechaa nke a ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe, bịa soro m.”[23] Mgbe nwoke ahụ nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ, obi jọkwara ya njọ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya.

MAK ۱۲:۴۱-۴۴
[۴۱] Emesịa, Jisọs gara nọdụ ala nꞌebe ọ ga-anọ na-ahụ ndị mmadụ mgbe ha na-etinye onyinye ha nꞌime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara tụnye ego buru ibu.[۴۲] Ma otu nwanyị batara. Ọ bụ ogbenye, bụrụkwa onye di ya nwụrụ. Ọ tụnyere mkpụrụ ego ọla abụọ ntakịrị nke ruru otu kobo.[۴۳] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a.[۴۴] Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.”

MATIU 25:14-30
[14] “A ga-ewerekwa alaeze eluigwe tụnyere akụkọ otu nwoke chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya nile nye ha ego nꞌotu nꞌotu, ka ha jiri ya malite ịzụ ahịa tutuu ruo mgbe ọ ga-alọta.[15] “O nyere ohu ya nke mbụ narị naịra ise. Ohu nke abụọ ka o nyere narị naịra abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu narị naịra. O nyere ha nꞌotu nꞌotu dị ka ike ha ha. Mgbe o mesịrị otu a, ọ hapụrụ ha gaa ije ya.[16] Ohu ahụ natara narị naịra ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o ritere narị naịra ise ọzọ nꞌuru.[17] Otu a kwa, onye nke e nyere narị naịra abụọ zụpụtakwara narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.[18] “Ma ohu ahụ natara otu narị naịra gara gwuo ala lie ya, nꞌihi ichezi ya nke oma.[19] “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ha ukwu lọtara site nꞌije ya. Ọ kpọkọtara ha nile ka ha gụzie ego ya.[20] Nwoke ahụ o nyere narị naịra ise batara wetakwa narị naịra ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘I nyere m narị naịra ise, ma ugbu a azụpụtala m narị naịra ise ọzọ.’[21] “Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’[22] “Onye nke e nyere narị naịra abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m narị naịra abụọ. Lee nꞌebe a, azụpụtala narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.’[23] “Nna ya ukwu sịrị, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’[24] “Onye e nyere otu narị naịra batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nꞌebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nꞌebe ị na-agbasaghị.[25] Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’[26] “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ! Ị maara na m na-ewe ihe ubi nꞌebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nꞌebe m na-agbasaghị.[27] Ị gaara etinye ego m nꞌaka ndị na-eche ego, ndị gaara akwụghachi ya na ụma ya.[28] Napụtanụ ya narị naịra ahụ o ji, ma were ya nye nwoke ahụ ji narị naịra ise![29] Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya.[30] Chụpụnụ ohu ọjọọ a na-abaghị uru nꞌọchịchịrị ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze ya.’

MATIU 13:22
Mkpụrụ nke dara nꞌala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nꞌakụ nke ụwa, kpagidere okwu dị nꞌime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ.

MATIU 6:33
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

MATIU 6:24
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.

1 KỌRINT 16:2
Ụbọchị ụka nile, ka onye ọ bụla site nꞌihe ọ kpatara nꞌizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Ihe mmadụ kwesịrị inye dabeere nꞌihe onye ahụ nwere, dị ka Onyenwe anyị si gọzie ya nꞌizu ụka ahụ. Nakọtaanụ onyinye ndị a nile tupu m bịa. Ka a hapụ iche tutuu ruo mgbe m bịara.

1 PITA 5:2
Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.

LUK 16:19-31
[19] “Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe mara mma, na-erikwa nri dị mma ụbọchị nile.[20] Nꞌọnụ ụzọ e si abanye nꞌụlọ onye ọgaranya a, otu nwoke ahụ ya jupụtara nꞌọnya na-edina nꞌebe ahụ oge nile! Aha nwoke a bụ Lazarọs.[21] Ọ gụsịrị Lazarọs agụụ ike iri ọ bụladị ibiribe nri si na tebulu onye ọgaranya ahụ daa nꞌala, ma o nweghị onye nyere ya. Nꞌezie, ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nꞌahụ[22] Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.[23] Nꞌọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nꞌoke mgbu, ọ hụrụ Eberaham ka ọ nọ nꞌebe dị anya. Ọ hụkwara Lazarọs ka ọ nọ nꞌakụkụ Eberaham.[24] “Onye ọgaranya ahụ kpọkuru Eberaham sị ya, ‘Nna m Eberaham, meere m ebere nꞌihi na anọ m nꞌoke mgbu nꞌebe a, biko zienụ Lazarọs ka o denye mkpịsị aka ntakịrị ya na mmiri bịa metụ ya nꞌire m ka akpịrị na-akpọ m nkụ dajụọ.’[25] “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu.[26] A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nꞌihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike isite nꞌebe a bịa nꞌebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nꞌebe unu nọ bịa nꞌebe a.’[27] “Onye ọgaranya ahụ gwara Eberaham sị ya, ‘Biko, arịọ m gị, nna m, zienụ ozi zigara ndị bi nꞌụlọ nna m nꞌụwa.[28] Nꞌihi na enwere m ụmụnne ise. Ka ndị ị ga-eziga gaa dọọ ha aka na ntị ka ha bie ụdị ndụ nke na-agaghị eme ka ha bịa nꞌebe ahụ ụfụ a m nọ.’[29] “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ụmụnne gị nwere akwụkwọ nsọ ebe Mosisi na ndị amụma ziri ụzọ e si eme ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ha gụọ ya, ma meekwa ihe ha gụtara ọ chọrọ ka ha mee.’[30] Ma onye ọgaranya ahụ zara sị, ‘Nna m Eberaham, nke ahụ agaghị ezu! Ọ dị mkpa na mmadụ ga-esite na ndị nwụrụ anwụ bilie gaa gwa ha ka ha chegharịa.’[31] “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ọ bụrụ na ha agaghị eme ihe ha ga-agụta nꞌakwụkwọ Mosisi na ndị amụma dere, echeghị m na ha ga-echegharị ma mmadụ site nꞌọnwụ bilie bịa gwa ha okwu.’ ”

1 TIMỌTI 6:10
Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju.

LUK 6:20
Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu.

MATIU 6:19-21
[19] “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha.[20] Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.[21] ***

Igbo Bible 1988
No Data