A A A A A

Ndụ: [Agha]


EFESỌS 6:11
Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu.

MATIU 24:6
Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola.

NKPUGHE 21:7
Onye ọ bụla meriri ga-eketa ngọzi ndị a nile. Aga m abụkwa Chineke ya, ya onwe ya ga-abụ nwa m.

ROM 8:37
Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị.

ROM 12:19
Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”

1 TIMỌTI 6:12
Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama.

2 KỌRINT 10:4
Nꞌihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke ụwa, kama ha bụ ngwa agha dị ike nke Chineke na-enye; ngwa agha ahụ anyị ji akwada nzube nile nke ekwensu wusiri ike, laa ya nꞌiyi.

ROM 13:4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

JEMES 4:1-2
[1] Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu?[2] Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a.

ROM 13:1-5
[1] Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.[2] Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.[3] Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ.[4] Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.[5] Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee.

Igbo Bible 1988
No Data