A A A A A

Ndụ: [Amaokwu maka Womenmụ nwanyị]


1 TIMỌTI 3:11
Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.

1 KỌRINT 11:12
Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa.

1 KỌRINT 15:10
Ma site nꞌamara Chineke, abụ m ihe m bụ taa. Chineke meere m ebere dị ukwuu, wụkwasị m amara ya. Ana m egosikwa na obi ebere Chineke nꞌebe m nọ abụghị ihe efu, nꞌihi na arụọla m ọrụ karịa ndị ozi nile. Ma nꞌezie ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ ya nꞌime m, ịgọzi m.

LUK 1:45
Ọṅụ dịịrị nwanyị ahụ kwenyere na Chineke ga-emezu ihe o kwere nkwa ime.”

1 PITA 3:1-2
[1] Unu ndị inyom nwere di na-eruberenụ di unu isi nꞌihi na ọ bụ site na mmeso unu na-emeso ha ka ndị na-ekweghị nꞌokwu Chineke nwere ike ikwere.[2] Ndụ ọma unu na-ebi pụrụ ime ka ha chegharịa karịa okwu ọnụ ọ bụla unu ga-agwa ha.

EFESỌS 5:22-23
[22] Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.[23] Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.

TAITỌS 2:3-5
[3] Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.

1 TIMỌTI 2:9-15
[9] Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma.[10] ***[11] Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.[12] Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.[13] Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv.[14] Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke.[15] Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.

Igbo Bible 1988
No Data