1 KỌRINT 15:58 |
Ya mere, ụmụnna m, ebe unu maara na unu ga-emeri nꞌikpeazụ, guzosienụ ike nꞌokwukwe unu. Bụrụnụ ndị guzo chịm, ndị nọgidesịrị ike na-arụ ọrụ Onyenwe anyị, nꞌihi na unu maara na ọ dịghị ọrụ ọ bụla unu rụụrụ Onyenwe anyị bụ ihe efu, ebe ha ga-adị mgbe anyị bilitere nꞌọnwụ. |
|
1 KỌRINT 16:13 |
Na-echenụ nche mgbe nile, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. |
|
1 PITA 5:5 |
Nꞌotu aka ahụ, unu ụmụ okorọbịa, doonu onwe unu nꞌokpuru ndị bụ okenye. Unu nile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nꞌihi na Chineke na-enye onye dị umeala nꞌobi amara na ngọzi ya, ma onye mpako ka ọ na-eguzo imegide. |
|
1 TIMỌTI 4:8 |
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu. |
|
1 TIMỌTI 4:12 |
Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya nꞌihi na ị bụ okorọbịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịma atụ na ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe. Mee ka ha soro ụzọ i si ezi ihe na ụzọ i si ebi ndụ gị. Bụrụkwa ihe ịma atụ nye ha, ma ọ bụ ihe ilere anya nꞌime okwukwe gị, na ịhụnanya gị, na iche uche zuru oke gị. |
|
2 KỌRINT 4:16 |
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. |
|
GALETIA 1:10 |
Eji m aka na unu na-ahụ ugbu a, na achọghị m isite nꞌokwu ire ụtọ, mee ka unu nabata m, kama ihe m chọrọ bụ nanị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Nꞌihi na a sị na m chọrọ ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ onye na-ejere Kraịst ozi. |
|
HIBRU 4:12 |
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. |
|
JEMES 5:16 |
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya. |
|
LUK 10:27 |
Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.” |
|
1 KỌRINT 10:12-13 |
[12] Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie.[13] Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị. |
|
MATIU 6:19-20 |
[19] “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha.[20] Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa. |
|
ROM 12:1-2 |
[1] Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.[2] Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke. |
|
HIBRU 10:24-25 |
[24] Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu.[25] Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso. |
|
JEMES 1:19-20 |
[19] Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.[20] Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe. |
|
2 TIMỌTI 3:16-17 |
[16] Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.[17] Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla. |
|
1 TIMỌTI 6:11-12 |
[11] Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ.[12] Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama. |
|
1 PITA 5:8-9 |
[8] Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.[9] Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile. |
|
MAK 10:43-45 |
[43] Ma nꞌetiti onwe unu ọ gaghị esi otu a dịrị. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye ukwu, ọ ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu ozi.[44] Onye ọ bụla kwa chọrọ ịbụ onye dị ukwuu karịa unu nile, kwesịrị ịbụ onye na-ejere onye ọ bụla nꞌime unu ozi.[45] Nꞌihi na mụ onwe m, Nwa nke mmadụ, abịaghị nꞌụwa ka ndị mmadụ jeere m ozi. Kama abịara m ijere ndị mmadụ ozi, na inye ndụ m ka ọ bụrụ ihe a ga-eji gbapụta ọtụtụ mmadụ.” |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |