A A A A A

Ndụ: [Ọnwụnwa]


JEMES 1:13-18
[13] Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.[14] Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.[15] Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.[16] Ya mere, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu ụmụnna m.[17] Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.[18] Ọ bụ nanị Chineke kpebiri ime ka anyị dịrị ndụ site nꞌokwu ya bụ eziokwu. O mekwara nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anyị bụrụ ụmụ mbụ ọ mụrụ nꞌezinụlọ ọhụrụ ahụ o mere ka ọ dịrị.

LUK 22:40
Nꞌebe ahụ ọ gwara okwu sị, “Kpeenụ ekpere rịọọ Chineke, ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”

JỌN 8:6
Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.

MATIU 6:13
Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin.

LUK 11:4
Gbaghara anyị mmehie anyị, nꞌihi na anyị na-agbaghara onye ọ bụla mejọrọ anyị. Edubakwala anyị nꞌọnwụnwa.”

LUK 4:13
Mgbe ike gwụrụ ekwensu ịnwa Jisọs ọnwụnwa, ọ hapụrụ ya laa tutuu ruo mgbe ọ ga-enweta ohere ọzọ.

1 KỌRINT 7:2
Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

MATIU 4:7
Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”

MAK 8:11
Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.”

MATIU 22:18
Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nꞌobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?

JEMES 4:1-4
[1] Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu?[2] Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a.[3] Ọ bụladị mgbe unu rịọrọ Chineke, ọ dịghị enye unu ihe unu rịọrọ ya nꞌihi na ihe unu chọrọ iji ihe ndị ahụ mee abụghị ezi ihe. Ọ bụ iji ha mee nanị ihe ga-atọ obi unu ụtọ.[4] Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi! Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Ọ bụrụ na uche unu bụ inwe aṅụrị nꞌihe nke ụwa, unu apụghị ịbụ enyi Chineke.

1 PITA 4:12
Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.

2 PITA 2:9
Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ.

GALETIA 4:14
Ma ọ bụ ezie na m nọ nꞌọrịa nꞌoge ahụ, unu eledaghị m anya, ma ọ bụ jụ ige m ntị, nꞌihi ahụ ọjọọ m nke gaara abụrụ unu ihe ọnwụnwa iji jụ m. Kama unu nabatara m, dị ka a ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke zitere, ma ọ bụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya.

1 TESALỌNAIKA 3:5
Dị ka m na-ekwu na mbụ, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, ezipụrụ m Timoti, ka ọ bịa chọpụta ma okwukwe unu ọ dịkwa chịm. Nꞌihi na ihe tụrụ m ụjọ bụ na ma eleghị anya onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ bụ ekwensu ga-emeri unu nꞌoge ọnwụnwa ndị a, mee ka ọrụ nile anyị rụrụ nꞌetiti unu bụrụ ihe lara nꞌiyi.

1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

1 TIMỌTI 6:9
Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ.

Igbo Bible 1988
No Data