A A A A A

Ndụ: [Ọnwụnwa]


JEMES 1:2-4
[2] Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.[3] Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.[4] Ya mere, agbalịla ịgbara nsogbu ọsọ, ma ọ bụ ịchọ ụzọ dị mfe ị ga-esi wepụ onwe gị na nsogbu ahụ. Kama nye ntachi obi gị ohere ka o too. Nꞌihi na mgbe o toro tozuo oke, ị ga-abụkwa onye pụrụ iguzo chịm, onye zuru ezu nꞌime onwe ya, nke ihe ọ bụla naagaghị akọ.

1 PITA 1:6
Ya mere, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nꞌihi na ụbọchị ga-ewetara unu oke ọṅụ na-abịa. Ọ bụ ezie na unu nọ nꞌọnọdụ mwute ugbu a nꞌihi ọtụtụ mkpagbu na ọnwụnwa na-abịakwasị unu, ma ihe ndị a nile na-adị nanị nwa oge.

JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

ROM 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike.

JEMES 1:12
Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya.

1 PITA 5:10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.

ROM 8:18
Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.

1 PITA 4:12
Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.

1 TESALỌNAIKA 5:16-18
[16] Na-aṅụrịnụ ọṅụ nꞌime okwukwe unu oge nile.[17] Na-ekpenụ ekpere oge nile na-esepụghị aka.[18] Na-enyenụ Chineke ekele mgbe nile banyere nile, nꞌihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

ROM 5:3-5
[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.[4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.[5] Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.

MAK 4:17
Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị.

ROM 8:35
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!

1 PITA 4:12-13
[12] Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.[13] Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.

JEMES 4:7
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ.

2 KỌRINT 1:3-4
[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.[4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

FILIPAI 4:19
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị.

ROM 5:3-4
[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.[4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.

Igbo Bible 1988
No Data