A A A A A

Ndụ: [Mmekọahụ]


2 KỌRINT 12:21
Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.

EFESỌS 5:3
Ka ahapụ ịkọta akụkọ mmehie ịkwa iko, ma ọ bụ nke adịghị ọcha, ma ọ bụ nke inwe anya ukwu nꞌebe ihe ndị ọzọ nꞌetiti unu nwere dị. Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ya, nꞌihi na omume ọjọọ dị otu a ekwesịghị ụmụ Chineke.

EFESỌS 5:33
Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya.

GALETIA 5:19
Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.

HIBRU 13:4
Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.

1 KỌRINT 6:9
Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,

1 KỌRINT 6:18
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

MATIU 5:28
Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.

MAK 7:22-23
[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla.[23] Ihe ọjọọ ndị a nile na-esite nꞌime mmadụ pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

1 TESALỌNAIKA 4:3-5
[3] Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.[4] ***[5] Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo.

MAK 10:6-9
[6] Na mbụ, mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị, o sighị otu a dịrị. Chineke mere nwoke na nwanyị ka e jikọtaa ha nꞌotu, ka ha abụọ bụrụ otu nꞌọlụlụ di na nwụnye.[7] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ka e jikọtaa ya na nwụnye ya.[8] Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Mgbe ahụ ha agaghị abụkwa mmadụ abụọ, kama ha ga-abụ otu.[9] Ya mere, ihe ọ bụla Chineke jikọtara, ka mmadụ ọ bụla hapụ ịtọsa ya.”

1 KỌRINT 13:4-8
[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.[8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga.

1 KỌRINT 6:13-20
[13] Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.[14] Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie.[15] Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela.[16] Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”[17] Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ.[18] Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

Igbo Bible 1988
No Data