JỌN 14:6 |
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. |
|
JEMES 1:12 |
Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya. |
|
JỌN 6:54 |
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ. |
|
JỌN 11:25-26 |
[25] Ma Jisọs gwara ya sị, “Mụ onwe m bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa m na-enye ha ndụ ọzọ. Onye ọ bụla kweere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.[26] Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?” |
|
JỌN 6:51 |
Abụ m nri na-enye ndụ nke si nꞌelu bịa. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nri nke m na-enye bụ anụ ahụ m, nke e nyere maka ịgbapụta ụwa nile.” |
|
NKPUGHE 21:27 |
Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla rụrụ arụ ga-abata nꞌime ya. Otu a kwa ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, ma ọ bụ onye ụgha ga-abata nꞌime ya. Kama ndị ga-abata nꞌime ya bụ nanị ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |