A A A A A

Ndụ: [Rentzụ ụmụ]


KỌLỌSI 3:21
Unu bụ nne na nna, unu emela ihe ga-ebutere ụmụ unu iwe, ka ha ghara inwe obi ụfụ nꞌebe unu nọ.

EFESỌS 6:4
Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.

HIBRU 12:11
Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.

MATIU 6:33-34
[33] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.[34] “Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

1 PITA 5:2-3
[2] Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.[3] Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha.

ỌLU OZI 2:38-39
[38] Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.[39] Nꞌihi na Chineke kwere unu nkwa a, unu na ụmụ ụmụ unu. Nkwa a dịkwara mmadụ nile nꞌebe nile. Ọ dịrị onye ọ bụla Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ọ bịakwute ya!”

2 TIMỌTI 3:14-16
[14] Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nꞌime eziokwu ahụ e ziri gị. Nọgidesie ike nꞌime ha, nꞌihi na gị onwe gị maara na ha bụ eziokwu. Ndị ziri gị eziokwu a bụkwa ndị i kwesịrị ịtụkwasị obi.[15] Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs.[16] Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.

EFESỌS 6:1-4
[1] Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nꞌihi na nke a bụ ọrụ unu dị ka ndị nke Kraịst. Ọ bụkwa ihe ziri ezi ka unu mee.[2] “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.[3] Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.”[4] Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.

HIBRU 12:7-11
[7] Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.[8] Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba.[9] Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.[10] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya.[11] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.

TAITỌS 2:2-8
[2] Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.[3] Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.[6] Nꞌotu ụzọ ahụ kwa, gwakwa ụmụ okorọbịa ka ha nwee akọnuche zuru oke.[7] Nꞌebe a ka gị onwe gị ga-abụrụ ha ihe ịma atụ na ihe ilere anya nꞌịrụ ọrụ ọma. Mee ka ihe nile ị na-eme gosi na ị hụrụ eziokwu ahụ nꞌanya, na ị bụkwa onye na-adịghị eji ya egwuri egwu.[8] Hụ na mkparịta ụka gị nile bụ site nꞌuche zuru oke, nke guzokwa ọtọ. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla bịakwutere gị ka gị na ya rụrịtaa ụka laa nꞌihere, nꞌihi enweghị ihe ọ bụla o jidere aka ọ ga-eji kwujọọ gị.

Igbo Bible 1988
No Data