A A A A A

Ndụ: [Mgbu]


NKPUGHE ๒๑:๔
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”

MATIU 4:23-25
[23] Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.[24] Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.[25] Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya.

2 KỌRINT 1:3-8
[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.[4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.[5] Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst.[6] Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.[7] Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị.[8] Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nꞌEsia. Nꞌezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesị dịrị ndụ.

1 PITA 4:12-19
[12] Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.[13] Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.[14] Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe ọ bụla a na-abụ unu ọnụ, ma ọ bụ na-ekwutọ unu, nꞌihi na unu bụ ndị na-eso Kraịst. Nke a na-ezipụta na Mmụọ ahụ dị ebube, Mmụọ Chineke, bi nꞌime unu.[15] Ka onye ọ bụla nꞌime unu ghara ịta ahụhụ nꞌihi na o gburu mmadụ ma ọ bụ dị ka onye ohi, ma ọ bụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nꞌaka ike.[16] Ma ihere ekwesịghị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke ekele na a na-akpọ unu ndị Kraịst.[17] Nꞌihi na oge ikpe ikpe eruola, ọ ga-amalịtekwa nꞌebe ndị Chineke nọ. Ọ̀ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwereghị na Kraịst?[18] Ọ̀ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzọpụta ndị ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie?[19] Ya mere, ọ bụrụ na unu na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, gaanụ nꞌihu na-eme ihe ziri ezi. Nyefeekwanụ onwe unu nꞌaka Chineke onye kere unu, onye kwesịrị ntụkwasị obi.

JỌN 16:16-24
[16] Ọ fọdụrụ nwa oge ugbu a unu agaghị ahụkwa m anya ọzọ. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ. Nke a bụ nꞌihi na ana m alakwuru Nna m.”[17] Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.”[18] Ndị ọzọ sịkwara, “Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ọ̀ fọdụrụ nwantịị unu agaghị ahụ m anya ọzọ ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, unu ga-ahụkwa m anya?’ ”[19] Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru?[20] Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ.[21] Mgbe nwanyị dị ime na-achọ ịmụ nwa, ọ naanọ nꞌọnọdụ mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nꞌihi na ọ mụpụtala nwa nwoke ya.[22] Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ.[23] Mgbe ụbọchị ahụ ga-erukwa, ọ dịghị ihe ga-adị unu mkpa. Ọ dịkwaghị ihe unu ga-arịọ nꞌaka m. Unu ga-ajụ Nna m ihe nile. Ọ ga-enyekwa unu nꞌihi na unu na-arịọ ha nꞌaha m.[24] Ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nꞌaha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka ọṅụ unu zuokwa oke.

HIBRU ๑๒:๑-๑๑
[๑] Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu.[๒] Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.[๓] Na-atụgharịnụ uche nꞌihe banyere Jisọs oge nile. Tụgharịanụ uche banyere mmeso o mesoro ndị mmehie ahụ megidere ya. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịda mba nꞌọsọ unu na-agba.[๔] Chetanụ na mmadụ ọ bụla anwụbeghị nꞌetiti unu nꞌihi ọgụ nke unu na-alụso mmehie.[๕] Unu echefuola ihe akwụwkọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka Chineke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ sị: “Nwa m ewela iwe mgbe Chineke na-apịa gị ụtarị. Adala mba mgbe ọ na-egosi gị ụzọ i siri mejọọ.[๖] Nꞌihi na onye Chineke hụrụ nꞌanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”[๗] Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.[๘] Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba.[๙] Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.[๑๐] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya.[๑๑] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.

ROM 8:18-28
[18] Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.[19] Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya.[20] Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na,[21] otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha.[22] Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ.[23] Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.[24] A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.[25] Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ.[26] Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.[27] Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ.[28] Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

Igbo Bible 1988
No Data