A A A A A

Ndụ: [Ibute Chineke ụzọ]


ROM 1:16
Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ.

MATIU 6:33
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

MATIU 22:37
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’

GALETIA 2:20
ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

MATIU 6:31-33
[31] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?[32] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.[33] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

1 KỌRINT 1:18
Nꞌanya ndị na-efu efu, ozi ọma Kraịst bụ ihe nzuzu ma nꞌanya ndị a na-azọpụta azọpụta, ọ bụ ike Chineke.

NKPUGHE 2:4
“Ma nke a bụ ihe m nwere megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere nꞌebe m bọ. Ị hụkwaghị m nꞌanya dị ka i hụrụ m na mmalite.

HIBRU 12:2
Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.

MATIU 6:24
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.

KỌLỌSI 3:1-4
[1] Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.[2] Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.[3] Nꞌihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nꞌime Chineke site na Kraịst.[4] Mgbe Kraịst, onye ahụ ji ndụ unu nꞌaka ya ga-alọghachi, unu ga-enwukwa dị ka ya, soro ya keta oke nꞌebube ya.

ROM 1:20
Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke.

ROM 15:13-19
[13] Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.[14] Amaara m, ụmụnna m, na unu jupụtara nꞌezi ndụ, na mmụta. Amakwaara m, na unu maara ihe ndị a nile ruo izi ya ndị ọzọ.[15] Ma ana m ede ụfọdụ ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na amaara m na ihe dị mkpa bụ nanị ime ka unu cheta ha. Nꞌihi na site nꞌamara ahụ Chineke nyere m,[16] abụ m onyeozi Kraịst; ọrụ pụrụ iche e nyere m bụ igbasara ndị mba ọzọ ozi ọma, na iche ha nꞌihu Chineke dị ka aja dị ụtọ nke Chineke ga-anabata. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ emeela ka unu bụrụ ndị dị ọcha, ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ.[17] Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ m mere, ma ọ bụrụ na m anya isi nꞌọrụ ahụ nile Kraịst rụrụ site nꞌaka m.[18] Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu otu Kraịst si jiri ndị ọzọ rụọ ọrụ ya. Ma nꞌihe banyere mụ onwe m, amaara m na Kraịst esitela nꞌokwu ọnụ m, na ihe ndị ọzọ m mere mee ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke, ka ha bụrụ ndị na-erubere ya isi.[19] Emeela m ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke site na nkwusa m, site nꞌụdị ndụ m biri nꞌetiti ha, na sitekwa nꞌọrụ ịrịba ama nile m rụrụ nke ha hụrụ, bụ ọrụ m rụrụ site nꞌike Mmụọ Nsọ Chineke. Nꞌụzọ dị otu a emezuola m ihe Chineke chọrọ ka m mee, site nꞌikwusa ozi ọma Kraịst site na Jerusalem ruo nꞌobodo Ilirikum.

EFESỌS 3:7
Abụrụla m onye nkwusa ozi ọma a, nꞌihi na Chineke nyere m ọrụ a dị ka onyinye site nꞌịrụ ọrụ nke ike ya.

ROM 9:22
Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha.

JỌN 3:30
Ya mere, nwoke ahụ kwesịrị ịdị elu nke ukwuu mgbe mụ onwe m na-adị ala.

MATIU 6:19-21
[19] “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha.[20] Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.[21] ***

JỌN 15:5
“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ nꞌezie. Unu onwe unu bụkwa alaka nke m. Onye ọ bụla na-anọgide nꞌime m, ma mụ onwe m kwa nꞌime ya, na-amị mkpụrụ nke ukwuu. Nꞌihi na e wezụga m, unu enweghị ike ime ihe ọ bụla.

MATIU 24:12
Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu.

ỌLU OZI 20:35
Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ”

ROM 8:5
Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

2 KỌRINT 12:7-10
[7] Ma nꞌihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesị, Chineke emeela ka m nwee ọrịa na-egbu m mgbu oge nile. Ahụ mgbu a nọ ọnọdụ dị ka onyeozi ekwensu. Ọ naenye m nsogbu na-egbukwa m mgbu, ime ka, m ghara iweli onwe m elu.[8] Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọọ Chineke ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.[9] Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.[10] Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.

Igbo Bible 1988
No Data