A A A A A

Ndụ: [Egwu]


EFESỌS 5:19
Gosinụ ọṅụ unu site nꞌisoro ndị enyi unu ịbụ abụ ọma, na abụ nile dị iche iche e ji eto Onyenwe anyị. Bụọnụ abụ mgbe nile na-eto Onyenwe anyị nꞌobi unu.

HIBRU 2:12
Jisọs sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Abụ Ọma sị, “Aga m agwa ụmụnna m ihe banyere Chineke bụ Nna m. Anyị nile ga-eji otu olu too ya. Aga m ekwuwa aha Chineke nꞌọgbọ ọha.”

KỌLỌSI 3:16
Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.

NKPUGHE 14:3-4
[3] Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị a, bụ ndị na-abụ abụ ahụ. Ọ bụkwa abụ ọhụrụ ka ha na-abụ. Ha nọkwa nꞌihu ocheeze Chineke na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ, na nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-abụ abụ a. O nweghị onye ọzọ maara abụ a karịa ndị a na-abụ ya. Nꞌihi na ha bụ ndị e si nꞌụwa gbapụta.[4] Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nꞌebe ụmụ nwanyị dị, ndị dị nsọ nꞌime mmụọ ha dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ha bụ ndị e si nꞌetiti ndị mmadụ bi nꞌụwa gbapụta, ka ha bụrụ onyinye e doro iche nye Chineke na Nwa atụrụ ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data