A A A A A

Ndụ: [Mfu]


1 KỌRINT 3:15
Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọ bụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nꞌiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma nzọpụta ahụ ga-adị ka a ga-asị na e si nꞌụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.

ỌLU OZI 27:21
Nꞌoge a nile o nweghị onye ọ bụla nri ọ bụla bara ọnụ. Ma nꞌikpeazụ, Pọl kpọrọ ndị na-eso ụgbọ ahụ sị ha, “Ndị iko m ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nꞌokwu m na mbụ anyị agaraghị ahapụ Ọnụ mmiri ọma. Anyị gaara agbanarị oke nsogbu an ntụfu ndị a nile.

FILIPAI 3:7-8
[7] Ma ihe ndị a nile m gụrụ dị ka ihe bara uru nꞌoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru. Ugbu a, achịfuola m ha nile, ka m nwee ike ịtụkwasị Kraịst obi, na inwe olileanya nanị nꞌime ya.[8] Ee, akpọọla m ihe ndị a nile ihe efu, nꞌihi na a pụghị iji ha tụnyere ihe dị oke ọnụ ahia dị ka ịmazu Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Etufuola m ihe ndị a nile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike nwezuo Kraịst.

1 KỌRINT 3:13-15
[13] Ma otu ụbọchị na-abịa mgbe ọrụ nke onye ọ bụla rụrụ ga-apụta ìhè, ụbọchị ahụ a ga-anwapụta ụdị ihe anyị ji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. A ga-esite nꞌọkụ na-enwụsi ike wefee ọrụ nile onye ọ bụla rụrụ lee ọrụ ahụ ule, ịchọpụta ma ọrụ ahụ ọ ga-adịgide adịgide.[14] Nꞌụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọ bụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nꞌelu ntọ ala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.[15] Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọ bụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nꞌiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma nzọpụta ahụ ga-adị ka a ga-asị na e si nꞌụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.

NKPUGHE 21:4
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”

MATIU 5:4
Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi.

JỌN 8:32
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”

1 TIMỌTI 3:15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.

1 KỌRINT 15:55
Ọnwụ, olee ebe ike ahụ i ji emeri mmadụ dị? Gị ọnwụ ebee ka ihe ahu i ji agba mmadụ dị?”

JỌN 6:54
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.

MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.

JỌN 14:1-3
[1] “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.[2] Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.[3] Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.

JỌN 5:28-29
[28] Ka ọ hapụ iju unu anya, oge na-abịa mgbe ndị nwụrụ anwụ nọkwa nꞌili gaanụ olu Ọkpara Chineke.[29] Ha ga-esitekwa nꞌili ha pụta. Ndị rụrụ ezi ọrụ ga-abanye na ndụ ebighị ebi. Ma ndị ọrụ ọjọọ ga-abanye nꞌọmụma ikpe ebighị ebi.

ROM 14:8
Ma anyị na-adị ndụ, ma ọ bụ na anyị na-anwụ anwụ, anyị bụ nke Chineke.

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

1 TESALỌNAIKA 4:13-18
[13] Otu ọ di ụmụnna anyị, achọrọ m ka unu mata ihe bụ ọnọdụ ụmụ Chineke, mgbe ha dara nꞌụra ọnwụ. Mgbe unu maara nke a unu agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ unu adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ nꞌetiti unu.[14] Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ.[15] Nꞌihi na, ihe m na-agwa unu ugbu a si nꞌọnụ Onyenwe anyị nꞌonwe ya. Anyị bụ ndị dị ndụ mgbe Onyenwe anyị ga-alọta, agaghị eburu ndị dara nꞌụra ọnwụ ụzọ bilite.[16] Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.[17] Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nꞌụwa, ka a ga-eweli elu nꞌime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.[18] Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-akasịrịta ibe unu obi mgbe nile.

GALETIA 1:19
Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.

1 TESALỌNAIKA 4:16
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.

JỌN 11:25
Ma Jisọs gwara ya sị, “Mụ onwe m bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa m na-enye ha ndụ ọzọ. Onye ọ bụla kweere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.

1 KỌRINT 15:54
Mgbe nke a mere, ihe ahụ e dere nꞌakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ nke sịrị, “E lomiela ọnwụ, meriekwa ike ya nile.

2 KỌRINT 5:8
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.

1 TESALỌNAIKA 4:13-14
[13] Otu ọ di ụmụnna anyị, achọrọ m ka unu mata ihe bụ ọnọdụ ụmụ Chineke, mgbe ha dara nꞌụra ọnwụ. Mgbe unu maara nke a unu agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ unu adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ nꞌetiti unu.[14] Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ.

2 KỌRINT 5:10
Nꞌihi na anyị nile ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Kraịst, ka o kpee anyị ikpe. Mgbe ahụ onye ọ bụla nꞌime anyị, nꞌotu nꞌotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nꞌime ụwa si dị.

MATIU 25:21
“Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’

ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

HIBRU 9:27
Nꞌihi na dị ka o si bụrụ ihe a kwadobeere mmadụ na ọ ga-anwụ nanị otu ugboro, ma nke a gasịa ikpe eso ya,

JỌN 3:3-5
[3] Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”[4] Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”[5] Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.

HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

JỌN 11:11-13
[11] Jisọs gwakwara ha sị, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ugbu a ana m aga ịkpọte ya nꞌụra.”[12] Ndị na-eso ụzọ ya, ebe ha na-eche ihe banyere nanị ụra efu, sịrị, “Ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-etetanụ nꞌonwe ya.”[13] Ma Jisọs maara na ha aghọtaghị na ihe ọ na-akọwara ha bụ na Lazarọs anwụọla.

ỌLU OZI 2:29
“Ụmụnna m, cheenụ echiche banyere nna nna anyị Devidi. Unu maara na ọ nwụrụ, e lie ya. Ebe e liri ya ka anyị nile mazuru taa.

Igbo Bible 1988
No Data