A A A A A

Ndụ: [Infertilidade]


1 SAMUEL 2:21
O Senhor visitou Ana, e ela concebeu, dando à luz três filhos e duas filhas. Entretanto, o menino Samuel crescia na presença do Senhor.

HIBRU 11:11
Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma ọ tụkwasịrị obi na Chineke ga-edebezu nkwa ya. Nꞌihi nke a Chineke nyere ya ike ịmụta nwa.

1 KỌRINT 3:16
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke. Ọ̀ bụ na unu aghọtakwaghị na Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime unu?

JEMES 1:17
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.

JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”

MAK 11:24
“Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

ROM 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike.

LUK 1:36-37
[36] I chetara Elizabet onye ikwu gị? Agadi ahụ? Ndị mmadụ sị na ọ gaghị amụlitekwa nwa, ma gịnị mere ugbu a? Ọ dị ime ọnwa isii ugbu a o merela agadi.[37] O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.”

ROM 5:3-5
[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.[4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.[5] Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.

LUK 1:13-21
[13] Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn.[14] Ọmụmụ nwanta a ga-ewetara unu oke ọṅụ na obi ụtọ. Ọtụtụ mmadụ ga-esorokwa unu ṅụrịa ọṅụ.[15] Nꞌihi na nwanta ahụ ga-abụ onye dị ukwuu nꞌanya Chineke. Ọ gaghị emetụ mmanya ọ bụla aka, ọ gaghị aṅụkwa mmanya na-egbu egbu, nꞌihi na site nꞌafọ nne ya, Chineke ga-emejupụta ya na Mmụọ Nsọ.[16] Ọrụ ya ga-abụ ịkpọghachite ọtụtụ ụmụ Izirel nꞌebe Onyenwe ha na Chineke ha nọ.[17] Dị ka Ịlaija siri bụrụ nwoke dị ike, na onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, otu a ka Jọn ga-adị. Ọ bụ ya ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ na-abịa, kwadoo ndị mmadụ ịnabata Onyenwe anyị. Jọn ga-emekwa ka udo dịrị nꞌetiti ndị nna na ụmụ ha, ọ ga-akpọghachitekwa ndị na-enupụ isi mee ka ha bụrụ ndị ga-eche uche dị ka ndị ezi omume.”[18] Zakaraya jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị ya, “Olee otu m ga-esi mata na ihe ị gwara m bụ eziokwu? Ị hụlanụ na abụrụla m agadi nwụnye m bụkwa agadi.”[19] Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Aha m bụ Geburel. Ọ bụ nꞌihu Chineke, onye zitere m iwetara gị akụkọ ọma a ka m na-anọ ụbọchị nile.[20] Geekwa ntị ka m gwa gị! Ebe ị jụrụ ikwenye nꞌihe m gwara gị, a ga-anapụ gị ike ikwu okwu. Ị gaghị ekwukwa okwu ọ bụla, tutuu ruo mgbe okwu a m gwara gị mezuru. Nꞌihi na okwu a m gwara gị ga-emezu mgbe oge ya ruru.”[21] Mgbe ihe ndị a nile na-eme, ndị mmadụ ahụ gbakọrọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nọkwa na-eche Zakaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nꞌime ime ụlọ nsọ ukwu ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data