A A A A A

Ndụ: [Hel]


NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”

MATIU 25:46
“Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

2 TESALỌNAIKA 1:9
A ga-etinye ndị a nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya ruo mgbe ebighị ebi,

MATIU 13:50
A ga-atụba ndị ọjọọ nꞌime ọkụ. Nꞌebe ahụ ka ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.

ỌLU OZI 2:27
Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m nꞌala mmụọ. Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke onye gị dị nsọ ka o ree ure.

MAK 9:43
“Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ dịrị gị mma iji otu aka dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, karịa na ị ga-eji aka abụọ banye nꞌọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ na-adịghị anyụ anyụ.

JUD 1:7
Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.

MATIU 13:42
Ha ga-atụba ndị a nꞌime ọkụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.

MATIU 25:41
“Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.

NKPUGHE 19:20
Ma e jidere anụ ọhịa ọjọọ ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ nwere ike ime ihe ịtụnanya mgbe ọ bụla anụ ọhịa ọjọọ ahụ nọ nsọ. Ọrụ ịtụnanya nke o ji duhie ndị nile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị kpọrọ isi ala nye oyiyi ya. Ha abụọ, anụ ọhịa ahụ, na onye amụma ụgha ya, ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye.

MATIU 16:19
Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.”

2 PITA 2:4
Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

NKPUGHE 20:13-14
[13] Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.[14] Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.

MATIU 10:28
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ.

Igbo Bible 1988
No Data