A A A A A

Ndụ: [Obi .tọ]


ROM 5:2
Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya.

2 KỌRINT 12:10-11
[10] Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.[11] Ọ bụ unu mere m ji si otu a kwuo okwu. Nꞌihi na ọ bụ onwe unu kwesịrị ide ihe ndị a banyere m, ọ bụghị m kwesịrị ide ha. O nweghị ihe ọ bụla mmadụ ndị a unu na-anabata nwere nke m na-enweghị. Ma nꞌezie, abụghị ihe ọ bụla.

MATIU 5:8
Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya.

1 JỌN 3:18
Ndị m hụrụ nꞌanya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nꞌebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị nꞌegbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site nꞌokwu ọnụ anyị na omume anyị.

1 PITA 4:13
Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.

Igbo Bible 1988
No Data