2 KỌRINT 6:18 |
Mụ onwe m ga-abụ Nna unu, unu onwe unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ndị nwanyị.” |
|
JEMES 1:27 |
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa. |
|
MATIU 25:40 |
“Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ. |
|
JỌN 1:12-13 |
[12] Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke.[13] A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya. |
|
GALETIA 4:4-5 |
[4] Ma mgbe oge a kara aka ruru, oge ahụ Chineke kpebiri, o zitere Ọkpara ya, ka nwanyị mụọ ya dị ka onye Juu.[5] Chineke zitere ya ka ọ gbapụta anyị, ndị nọ nꞌokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ Chineke nꞌezie. |
|
ROM 8:14-17 |
[14] Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.[15] Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị.[16] Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie.[17] Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |