A A A A A

Ndụ: [Ikpe ọmụma]


HIBRU 10:22
Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ.

JEMES 2:10
Nꞌihi na onye ọ bụla debere iwu nile ma daa nꞌotu, dara iwu dị ka a gaasị na ọ bụ iwu nile ka o mebiri.

HIBRU 10:2
Ọ bụrụ na iwu pụrụ ime ihe dị otu a otu ugboro ka a gaara achụ aja. Otu aja ahụ gaara ewepụkwa echiche mmehie ọ bụla nꞌime ndị chụrụ ya.

1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

ROM 8:1
Ya mere, ikpe ọmụma ọ bụla adịkwaghị ugbu a nye ndị nile nọ nꞌime Jisọs Kraịst.

HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.

2 KỌRINT 5:17
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.

ROM 3:21-23
[21] Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.[22] Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ.[23] Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.

2 KỌRINT 5:21
Kraịst emehieghị mgbe ọ bụla, kama, nꞌihi anyị, Chineke mere ka o kere oke nꞌime mmehie anyị, ka o si otu a mee ka e jikọtaa anyị na ya, ka anyị nwee oke nꞌime ezi omume Chineke na-enye.

1 JỌN 3:19-20
[19] Mgbe ahụ anyị pụrụ isite nꞌomume anyị mata nꞌezie na anyị na-eme ihe Chineke chọrọ. Mgbe ahụ kwa akọnuche anyị agaghị ama anyị ikpe, ọ bụladị ma anyị guzoro nꞌihu Chineke.[20] Nꞌihi na ọ bụrụ na akọnuche anyị ama anyị ikpe Chineke dị ukwuu karịa akọnuche anyị, ọ mazukwara ihe nile.

ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

NKPUGHE 12:10
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị.

2 KỌRINT 7:10
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.

HIBRU 4:16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.

ROM 8:31-39
[31] Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ọma ndị a nile Chineke meere anyị. Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye pụrụ iguzo megide anyị?[32] Tulee ya nꞌonwe gị: Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, nke weere ya nye nꞌihi mmehie anyị, ọ̀ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị?[33] Ònye pụrụ ịpụta nꞌihu Chineke boo anyị bụ ndị ya ọ họpụtara ebubo mmehie? Ònye ka ọ bụ? Chineke nꞌonwe ya ọ ga-ebo anyị ebubo nꞌihi mmehie anyị? Mba! Nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya gbaghaara anyị mmehie anyị, mee ka anyị na ya dị na mma.[34] Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.[35] Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba![36] Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.”[37] Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị.[38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.[39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.

ROM 3:26
Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie.

ROM 14:23
Ma onye ahụ maara na ihe ọ na-achọ ime bụ ihe ọjọọ ekwesịghị ime ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ emee ya, ọ bụụrụ ya mmehie. Nꞌihi na ihe ọ bụla na-esiteghị nꞌokwukwe bụ mmehie.

JỌN 3:17
Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.

ỌLU OZI 3:19
“Chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke! Ọ ga-ehichapụ mmehie unu.

1 JỌN 2:1
Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile.

LUK 15:18-19
[18] O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’[19] ***

MATIU 18:21-35
[21] Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?”[22] Jisọs zara sị ya, “Ọ dịghị, ọ bụghị ugbo asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa uzọ asaa.[23] “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.[24] Mgbe ha malitere na-apịazi, a kọtaara eze ahụ otu nꞌime ndị ohu ya ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ.[25] Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Eze ahụ nyere iwu ka e refuo ya na nwụnye, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere, nꞌihi ụgwọ o ji.[26] “Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’[27] “Eze ahụ jupụtara nꞌọmiko nꞌebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.[28] “Ma mgbe ohu ahụ sitere nꞌihu eze ahụ pụọ, o jekwuuru otu nwoke ji ya ụgwọ otu puku naịra. O jidere ya nꞌaka ike, machie ya aka nꞌakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a!’[29] “Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’[30] “Ma nwoke ahụ e ji ụgwọ achọghị ichere! O jidere nwoke ahụ, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji ya.[31] “Mgbe ndị enyi nwoke ahụ e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụrụ ihe mere enyi ha, ha jekwuuru eze ahụ, kọọrọ ya ihe nile ha hụrụ.[32] Eze ahụ kpọrọ nwoke a, nke ọ gbaghara ụgwọ nile o ji na mbụ sị ya, ‘Ajọ ohu! Nꞌebe a ka m nọ gbaghara gị.[33] Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’[34] “Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo.[35] Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.”

Igbo Bible 1988
No Data