A A A A A

Ndụ: [Nri]


JỌN 4:4-34
[4] Ma ọ ghaghị isite nꞌetiti obodo ndị Sameria gafee mgbe ọ na-aga.[5] Ihe dị ka oge ehihie, ọ banyere obodo nta Saika nke dị nꞌime Sameria.[6] Ọ bịaruru nꞌolulu mmiri Jekọb. Olulu mmiri e gwuru nꞌala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya. Ike gwụrụ Jisọs nꞌihi ogologo ije o jere nꞌime anwụ. Nꞌihi ya ọ nọdụrụ ala nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ izu ike.[7] Mgbe nwa oge nta gafere, otu nwanyị onye Sameria bịara nꞌolulu mmiri ahụ ịdọrọ mmiri. Jisọs rịọrọ ya ka o nyetụ ya mmiri ọṅụṅụ.[8] Ma nꞌoge a ọ bụ nanị Jisọs nọ, nꞌihi na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo ịzụta nri.[9] O juru nwanyị ahụ anya na onye Juu ga-arịọ onye Sameria e ledara anya, ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe a na-emetụbeghị mbụ. Ọ bụladị ekele ọnụ, ha adịghị ekelerịta onwe ha. Nwanyị a mere ka Jisọs mata nke a.[10] Ma Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị maara ụdị onyinye dị ebube Chineke ga-enye gị, matakwa onye m bụ, ị gaara arịọ ka m nye gị mmiri na-enye ndụ.”[11] Nwanyị a sịrị Jisọs, “I nweghị ụdọ ma ọ bụ bọketi. Olulu mmiri a dịkwa omimi. Ebeekwanụ ka ị ga-esi nweta mmiri ndụ ahụ ị ga-enye m?[12] E wezugakwa nke a, i chere na ị dị ukwuu karịa nna anyị ochie Jekọb onye gwuru olulu mmiri a? Olee otu ị ga-esi nye m mmiri dị mma karịa nke a ya na ụmụ ya na igwe ehi ya ṅụkwara?”[13] Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri a ga-emesị chọọ mmiri ọṅụṅụ ọzọ.[14] Ma mmiri nke m ga-enye onye ahụ ga-abụ isi iyi ebighị ebi nꞌime ya. Ọ ga na-asọgharị nꞌime ya ebighị ebi. Ọ ga-aghọkwa nꞌime ya ụzọ ndụ ebighị ebi.”[15] Nwanyị ahụ rịọrọ Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ. Ka m hapụkwa ịga ụzọ a dị anya ọzọ, nꞌihi ịdọrọ mmiri.”[16] “Gaa kpọta di gị,” ka Jisọs gwara ya.[17] Nwanyị ahụ zara sị, “Enweghị m di.” Jisọs sịrị ya, “Ị kwuru eziokwu.[18] Nꞌihi na i nweela di ise, ma nwoke nke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ị bụ onye eziokwu.”[19] Nwanyị ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe anyị, ị ga-abụrịrị onye amụma![20] Ma kọwaara m, gịnị mere unu ndị Juu jiri sị na Jerusalem bụ nanị ebe e kwesịrị ịnọ kpọọ isi ala nye Chineke. Anyị ndị Sameria sị na ọ bụ nꞌebe a, nꞌugwu Gerazim, ebe nna anyị ha kpọrọ isi ala nye Chineke.”[21] Jisọs zara ya sị, “Nwanyị, gee ntị ka m gwa gị, oge na-abịa mgbe ọ naagaghị adị mkpa ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Ma ọ bụ nꞌebe a ma ọ bụ na Jerusalem.[22] Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”[23] ***[24] ***[25] Nwanyị ahụ zara ya sị, “Amaara m na Onye nzọpụta ga-abịa, onye ahụ ha na-akpọ Kraịst. Mgbe ọ bịara, ọ gaeme ka ihe nile doo anyị anya.”[26] Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Abụ m Onye nzọpụta ahụ!”[27] Mgbe ọ na-ekwu okwu a, ndị na-eso ụzọ ya bịara. O juru ha anya ịhụ Jisọs ka ya na nwanyị a na-ekwurịta okwu. Ma ọ dịghị onye nꞌime ha jụrụ ya ihe mere o ji mee nke a ma ọ bụ ihe ha na-ekwu.[28] Otu mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ gbara ọsọ laghachi azụ nꞌime obodo gaa gwa onye ọ bụla bi nꞌobodo ahụ sị,[29] “Bịanụ lee nwoke gwara m ihe nile m mere! Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?”[30] Ya mere, ọtụtụ mmadụ siri nꞌime obodo ahụ pụta ịhụ Jisọs.[31] Mgbe ihe ndị a na-eme ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ na-arịọ ya ka o rie nri ha zụtara.[32] Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ dịghị mkpa! Ọ dị ihe oriri m nwere iri nke unu na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya.”[33] Ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha sị, “Onye kwanụ nyere ya ihe oriri?”[34] Ma Jisọs kọwaara ha sị, “Nri m bụ ime ihe bụ uche Chineke onye zitere m, na ịrụcha ọrụ o nyere m ka m rụọ.

JỌN 6:27-35
[27] Unu atụkwasịla obi unu nꞌihe na-ala nꞌiyi dị ka nri, kama chọọnụ ndụ ebighị nke Nwa nke mmadụ na-enye. Nꞌihi na Chineke Nna zitere ya ime nke a.”[28] Ha zara ya sị, “Gịnị ka anyị ga-eme nke ga-egosi na anyị na-arụ ọrụ Chineke?”[29] Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ otu ihe nanị, nke a bụkwa uche Chineke. Kwerenụ nꞌọnye ahụ Chineke zitere.”[30] Ha zara sị ya, “Olee ihe ịrịba ama ị ga-egosi anyị nke ga-eme ka anyị kwere na gị? Gịnị ka ị ga-eme?[31] Nna anyị ha riri mana mgbe ha jegharịrị nꞌọzara. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘O si nꞌeluigwe nye ha achịcha ha riri.’ ”[32] Jisọs sịrị ha, “Ọ bụghị Mosisi nyere ha nri ahụ. Ọ bụ Nna m. Ugbu a Nna m na-enye unu ezi nri ahụ si nꞌelu bịa.[33] Ezi nri a bụ Onye ahụ Chineke si nꞌelu zite. Ọ na-enye ụwa ndụ.”[34] Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye anyị nri a ụbọchị nile.”[35] Jisọs zaghachiri ha sị, “Abụ m nri na-enye ndụ. Onye ọ bụla na-abịakwute m agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ndị nile kweere na m nkụ.

MATIU 4:4
Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”

MATIU 5:6
“Ndị agụụ ezi omume na-agụ bụkwa ndị a gọzịrị agọzi, nꞌihi na afọ ga-eju ha.

MATIU 6:25
“Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya.

1 KỌRINT 6:13
Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.

1 KỌRINT 8:8
Ma chetanụ na ọ bụghị nri ga-eme ka anyị dị ezi ndụ nꞌihu Chineke. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe anyị ga-atufu.

1 KỌRINT 10:31
Ka m gwa gị ihe mere o ji dị mkpa. I kwesịrị ime ihe ọ bụla ị na-eme, ma ọ bụ iri nri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, i kwesịrị ime ihe nile nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Chineke otuto.

1 TIMỌTI 4:4-5
[4] Ihe nile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe oriri ọ bụla anyị na-ekwesịghị iri ma ọ bụrụ na anyị ji obi ụtọ na ekele nara ya,[5] rịọ Chineke ka ọ gọzie ya, nꞌihi na a na-eme ka nri ahụ bụrụ ihe dị mma site nꞌokwu Chineke na ekpere.

MAK 7:14-23
[14] Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ka ha bịa ya nso. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị, “Geenụ ntị, unu nile! Ghọtakwanụ ihe m ga-ekwuru unu ugbu a.[15] Ọ dịghị ihe ọ bụla banyere nꞌime mmadụ pụrụ ịmerụ ya. Nri ọ bụla adịghị nke pụrụ ịmerụ mmadụ. Kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nꞌime ya na-apụta, ihe ọ na-eche nꞌobi ya na nke ọ na-ekwupụta nꞌọnụ ya.”[16] ***[17] Emesịa, Jisọs hapụrụ ndị mmadụ ahụ banye nꞌime otu ụlọ. Nꞌebe ahụ ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya ka ọ kọwaara ha ihe okwu ahụ o kwuru pụtara.[18] Jisọs jụrụ ha sị, “Unu na-akọwa na unu aghọtaghị okwu ahụ? Ọ̀ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla unu riri apụghị ịmerụ unu?[19] Nꞌihi na ihe unu riri na-abanye nꞌafọ unu, ọ bụghị nꞌobi unu. Ihe ọ bụla banyekwara nꞌafọ na-emesịa pụọ.” (Ihe Jisọs na-akọwa nꞌebe a bụ na ụdị nri ọ bụla dị ọcha dịkwa mma oriri.)[20] Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ihe sitere nꞌime mmadụ pụta na-emerụ ya. Ya bụ, echiche mmadụ na ọchịchọ ya.[21] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye,[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla.[23] Ihe ọjọọ ndị a nile na-esite nꞌime mmadụ pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

Igbo Bible 1988
No Data