A A A A A

Ndụ: [Ezinụlọ]


JỌN 15:12-13
[12] Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.[13] Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.

1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

EFESỌS 6:4
Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.

MATIU 12:48-50
[48] Ma Jisọs zara ya sị, “Onye bụ nne m? Òlee ndị bụ ụmụnne m?”[49] Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m.[50] Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme ihe Nna m bi nꞌeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”

MATIU 19:18-19
[18] Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.[19] Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”

KỌLỌSI 3:13
Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.

GALETIA 6:10
Nꞌihi nke a, dị ka anyị si nwee oge, ka anyị na-arụ ezi ọrụ nꞌebe mmadụ nile nọ, ma nke ka nke, ka anyị na-arụ ezi ihe, karịsịa, nꞌebe ụmụnna anyị nꞌime Kraịst nọ.

1 KỌRINT 15:33-34
[33] Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha.[34] Sitenụ na ndụ mmehie pụta! Unu emehiekwala ọzọ. Ùnu makwaara na ụfọdụ nꞌime unu amaghị Chineke? Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.

1 KỌRINT 15:33
Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha.

LUK 11:13
“Ọ bụrụ na unu ndị ajọ omume pụrụ inye ụmụ unu ezi ihe, unu echeghị na nna unu bi nꞌeluigwe ga-esitekwa otu a were Mmụọ Nsọ ya nye ndị rịọrọ ya?”

Igbo Bible 1988
No Data