JỌN 3:16 |
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. |
|
1 JỌN 4:8 |
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya. |
|
JỌN 15:3 |
Ugbu a e meela ka unu dịrị ọcha site nꞌokwu nile m gwara unu. |
|
1 KỌRINT 13:13 |
Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya. |
|
1 PITA 4:8 |
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. |
|
1 JỌN 4:7 |
Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. |
|
1 KỌRINT 13:4-8 |
[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.[8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga. |
|
EFESỌS 5:25 |
Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya. |
|
1 JỌN 4:19 |
Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. |
|
ROM 5:8 |
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị. |
|
JỌN 14:15 |
“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. |
|
1 JỌN 4:10 |
Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị. |
|
KỌLỌSI 3:14 |
Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu. |
|
1 KỌRINT 16:14 |
Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọ bụla unu na-arụ. |
|
2 TIMỌTI 2:22 |
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ. |
|
1 JỌN 4:16 |
Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. |
|
JỌN 17:24 |
Biko Nna m, achọrọ m ka ndị nile kweere na m soro m bikọọ nꞌotu ebe. Ndị ahụ nile i nyere m site nꞌụwa, achọrọ m ka ha hụ otuto m nile, nke i nyere m site nꞌịhụnanya gị, nke i nwere nꞌebe m nọ malite na ntọ ala nke ụwa a. |
|
JỌN 13:35 |
Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” |
|
MATIU 5:43-48 |
[43] “A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’[44] Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.[45] Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.[46] Ọ bụrụ nanị ndị hụrụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-eme otu a.[47] Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọ bụla dị iche nꞌebe unu na ndị ọzọ nọ. Nꞌihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.[48] Unu kwesịrị izu oke nꞌịrụ ọrụ ọma, dị ka Nna unu bi nꞌeluigwe si zuokwa oke. |
|
1 KỌRINT 13:1-3 |
[1] A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.[2] A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla.[3] A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya. |
|
ROM 13:8 |
Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ. |
|
1 JỌN 4:7-8 |
[7] Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma.[8] Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya. |
|
1 JỌN 3:1 |
Lee ka Nna anyị bi nꞌeluigwe si hụ anyị nꞌanya, nꞌihi na o sitere nꞌamara ya mee ka a kpọọ anyị ụmụ ya. Nꞌezie, anyị bụkwa ụmụ Chineke. Ma ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị Chineke ha adịghị aghọta na anyị bụ ụmụ Chineke. |
|
LUK 6:35 |
“Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere. |
|
ROM 12:10 |
Hụrịtanụ onwe unu nꞌanya dị ka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụrụkwanụ ibe unu. |
|
MATIU 6:24 |
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ. |
|
ROM 13:8-10 |
[8] Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ.[9] Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.[10] O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile. |
|
1 KỌRINT 13:2 |
A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla. |
|
2 TIMỌTI 3:16 |
Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma. |
|
MATIU 6:33 |
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. |
|
2 KỌRINT 6:14 |
Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọ bụla. Nꞌihi na gịnị ka ezi omume na ihe ọjọọ nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? |
|
MATIU 19:5 |
Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’ |
|
ROM 4:22 |
Ọ bụ nihi ụdị okwukwe a Eberaham nwere ka Chineke ji gụọ ya nonye ezi omume, onye na-enwekwaghị mmehie ọ bụla. |
|
NKPUGHE 22:19 |
Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ewepụ okwu ọ bụla nꞌakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepu òke o nwere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, na òke o nwere nꞌobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |