A A A A A

Ndụ: [Ibu Ọnụ]


1 KỌRINT 7:5
Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

ỌLU OZI 13:2
Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.”

ỌLU OZI 14:23
Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi.

LUK 2:37
***

LUK 18:12
Ana m ebu ọnụ nꞌihi ịdị ọcha nꞌihu gị ugbo abụọ nꞌizu ụka. Ana m enye onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ihe nile m nwere oge nile.’

ỌLU OZI 13:3-4
[3] Ya mere, mgbe ha busịrị ọnụ nꞌime ekpere ha, e bikwasịrị Sọl na Banabas aka nꞌisi, zipụ ha ijere Chineke ozi.[4] Mmụọ Nsọ duuru ha gaa obodo Selusia. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ jeruo Saiprọs.

LUK 4:2-4
[2] Ebe ahụ ka ọ nọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ ndị a nile o righị nri ọ bụla. Nꞌikpeazụ, agụụ gụrụ ya.[3] Mgbe ahụ ekwensu bịara gwa ya sị, “Ọ̀ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a okwu ka ha ghọọrọ gị nri.”[4] Ma Jisọs zara ya sị, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ̀ bụghị nanị site nꞌiri nri ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ”

MATIU 6:16-18
[16] “Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha.[17] Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya.[18] Ka mmadụ ọ bụla hapụ ịmata na unu na-ebu ọnụ. Nna unu, onye maara ihe nile, ga-akwụghachikwa unu ụgwọ.

LUK 18:1-12
[1] Otu ụbọchị Jisọs kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya akụkọ iji gosi ha mkpa ọ dị ikpegide ekpere na-esepụghị aka tutuu Chineke aza ekpere ha.[2] Ọ sịrị ha, “O nwere otu ọkaikpe bi nꞌotu obodo, nke na-adịghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị emetụ ya nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya.[3] Nꞌobodo ahụ kwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ọkaikpe a oge nile na-arịọ ya ka o nyere ya aka megide onye iro ya.[4] Ma oge nile nwanyị a na-abịakwute ọkaikpe a, ọkaikpe a ekweghị inyere ya aka. Nꞌikpeazụ, nꞌihi na nwanyị a nyegidere ọkaikpe ahụ nsogbu, ọkaikpe a kwuru sị, ‘Ọ bụ ezie na m adịghị atụ egwu Chineke, ọ nakwaghị emetụ m nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu megide m. Ma nwanyị a enyekarịala m nsogbu. Aga m enyere ya aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na m ajụ inyere ya aka, ọ ga-aga nꞌihu na-abịakwute m, ọ gaghị enye m ohere izu ike.’ ”[5] ***[6] Mgbe ahụ Jisọs kwuru sị, “Leenụ ihe ajọ ọkaikpe a kwuru. Ọ bụrụ na mmadụ ọjọọ dị otu a nwere ike kpebie inyere nwanyị na-arịọsi ya arịrịọ ike aka,[7] ọ bụ na Chineke agaghị enyekwara ndị ahụ ọ họpụtara aka, bụ ndị ahụ na-akpọku ya ehihie na abalị. Ọ̀ ga-anọ tee anya ịbịa inyere ha aka?[8] Mba! O doro m anya na ọ ga-eme ọsịịsọ inyere ha aka. Ma ajụjụ m na-ajụ bụ nke a, mgbe m ga-alọghachi azụ, m ga-achọta mmadụ ndị kweere na m nꞌụwa?”[9] Jisọs kọrọ akụkọ a nꞌihi ndị na-eche nꞌobi ha na ha bụ ndị dị mma si otu a na-eleda ndị ọzọ anya.[10] Ọ gwara ha okwu sị, “Mmadụ abụọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ikpe ekpere. Otu onye nꞌime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ.[11] Onye Farisii guzoro ọtọ si otu a kpee ekpere ya nye Chineke sị, ‘Chineke, biko ekelee m gị, nꞌihi na adịghị m ka ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ. Anaghị m aghọgbu mmadụ, anaghị m akwa iko, abughị m onye mmadụ na-enweghi ike ịtụkwasị obi.[12] Ana m ebu ọnụ nꞌihi ịdị ọcha nꞌihu gị ugbo abụọ nꞌizu ụka. Ana m enye onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ihe nile m nwere oge nile.’

Igbo Bible 1988
No Data