A A A A A

Ndụ: [Icskpụrụ omume]


ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.

KỌLỌSI 3:17-23
[17] Ka ihe nile unu na-eme, ya na okwu unu na-ekwu, bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Jirikwanụ obi ekele bata nꞌihu Chineke bụ Nna anyị site nꞌaha Kraịst.[18] Unu bụ ụmụ nwanyị nwere dị, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu nꞌihi na nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst.[19] Ma unu ndị bụ di, unu enwela obi ilu nꞌebe nwụnye unu nọ, kama na-ahụnụ ha nꞌanya.[20] Unu bụ ụmụntakịrị, na-emenụ ihe na-atọ Chineke ụtọ site nꞌirubere nne na nna unu isi. Nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst.[21] Unu bụ nne na nna, unu emela ihe ga-ebutere ụmụ unu iwe, ka ha ghara inwe obi ụfụ nꞌebe unu nọ.[22] Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.[23] Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.

JỌN 16:13
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.

LUK 6:31
Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu.

LUK 16:10
Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.

ROM 1:26
Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.

ROM 2:1
Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ.

MATIU 7:12-21
[12] “Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri.[13] “Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe.[14] Ole na ole na-achọta ụzọ na-eduba na ndụ, nꞌihi na ọ dị warara.[15] “Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu.[16] Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara.[17] A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ.[18] Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma.[19] Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ.[20] Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya.[21] “Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.

JỌN 13:34-35
[34] “Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.[35] Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”

2 TIMỌTI 3:16-17
[16] Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.[17] Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

1 KỌRINT 6:9-11
[9] Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,[10] ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke.[11] Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.

ROM 13:8-10
[8] Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ.[9] Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.[10] O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile.

JEMES 1:12-15
[12] Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya.[13] Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.[14] Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.[15] Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.

MAK 12:28-31
[28] Otu nꞌime ndị ozizi iwu bịara nꞌebe ahụ nꞌoge ha na-ekwu okwu ahụ, guzo gee ntị nꞌihe ha na-ekwu. Mgbe ọ hụrụ na Jisọs nyere ndị Sadusii ahụ ezi ọsịsa, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Nꞌime iwu nile olee nke kachasị mkpa?”[29] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu ahụ kwuru sị, ‘Geenụ ntị ndị Izirel! Onyenwe anyị bụ nanị otu Chineke.[30] Unu kwesịrị iji obi unu nile na mkpụrụ obi unu nile, na echiche obi unu nile, na ike unu nile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nꞌanya.’[31] “Iwu ṅke abụọ, nke dịkwa mkpa, bụ nke sị, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.’ Iwu ọ bụla ọzọ adịghị nke karịrị ndị a mkpa.”

LUK 10:10-28
[10] “Kama ọ bụrụ na obodo ọ bụla ajụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nꞌokporo ụzọ obodo ahụ kwuo sị,[11] ‘Anyị na-ehichapụ aja obodo a nyapagidere anyị nꞌụkwụ, na-ahapụrụ unu ya. Matakwanụ nꞌeziokwu na alaeze Chineke abịala unu nso.’[12] Eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, Chineke ga-emere obodo Sodọm ebere karịa obodo ndị jụrụ ịnabata unu.[13] Ahụhụ dị ukwuu na-eche gị, gị obodo Korazin. Ahụhụ dị ukwuu dịkwa na-eche gị, gị obodo Betsaida. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ nile m rụrụ nꞌime unu nꞌobodo Taịa na Saidọn, ha gaara echegharị kemgbe. Ha gaara eyi uwe nkịkara, wụkwasị onwe ha ntụ nꞌisi igosi na ha esitela na mmehie ha chegharịa.[14] Ka m gwa unu eziokwu, Chineke ga-emere Taịa na Saidọn ebere karịa obodo Korazin na Betsaida.[15] Ma gị obodo Kapanọm! Ị̀ na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịdaru ala mmụọ!”[16] Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla gere ntị nꞌihe unu gwara ya, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọ bụla kwa jụrụ ịnabata unu, ọ bụ m ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọ bụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata Chineke onye zitere m.”[17] Emesịa, iri mmadụ asaa ahụ Jisọs zipụrụ jiri ọṅụ lọta gwa Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ọ bụladị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị sitere nꞌaha gị nye ha iwu ka ha pụta.”[18] Mgbe ahụ Jisọs kwuru okwu sị, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nꞌeluigwe daa dị ka mgbe amụma na-egbu na mbara eluigwe.[19] Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro.[20] Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.”[21] Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya.[22] Nna m enyela m ihe nile. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara Nna bụ, karịa Nna. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara Nna na ndị ahụ Ọkpara Nna chọrọ igosi onye Nna bụ.”[23] Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Unu bụ ndị Chineke gọzịri nꞌihi na o mere ka unu hụ ihe ndị a unu na-ahụ ugbu a.[24] Nꞌezie, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe unu na-anụ ugbu a, ma e nyeghị ha ohere ịhụ ya na ịnụ ya.”[25] Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?”[26] Jisọs zara ya sị, “Gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru banyere ajụjụ a? Gịnị ka ị gụtara?”[27] Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.”[28] Jisọs zara ya sị, “Ị zara nke ọma. Ugbu a, laa, gaa mee nke a: ị ga-enwekwa ogologo ndụ.”

EFESỌS 6:5-9
[5] Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.[6] Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.[7] Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya.[8] Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.[9] Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.

1 KỌRINT 13:1-13
[1] A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.[2] A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla.[3] A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya.[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.[8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga.[9] Ugbu a ihe anyị maara adịghị ukwuu, mmụta anyị na amụma anyị na-ebu ezughị oke, nꞌihi na ihe anyị maara bụ nanị nwa ntịị.[10] Ma mgbe e mere ka anyị zuo oke, mgbe ahụ, mkpa nke onyinye ndị a na-ezughị oke na-egboro anyị agaghị adịkwa. Onyinye ndị a ga-agwụsịkwa.[11] Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ.[12] Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a.[13] Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.

ROM 6:1-23
[1] Ugbu a, gịnị ọzọ kwa ka anyị gaekwu? Anyị ga-anọgide nꞌime mmehie ka Chineke nọgide na-emere anyị ebere, ma na-agbaghara anyị?[2] Tụfịakwa! Chineke ekwela! Olee otu anyị ga-esi nọgide na mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị.[3] Nꞌihi na unu kwesịrị ịmata, na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtara anyị na ya nꞌọnwụ ya.[4] Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.[5] Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nꞌọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nꞌọnwụ.[6] Nꞌihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kraịst nꞌelu obe, ime ka anụ ahụ mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nꞌiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nꞌịbụ ohu nye mmehie.[7] Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụrụla onye nwere onwe ya site nꞌebe mmehie dị.[8] Ọ bụrụkwa nꞌeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwaara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.[9] Nꞌihi na anyị maara na ebe Chineke mere ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie, Kraịst agaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ ọzọ.[10] Mgbe ọ nwụrụ, ọ nwụrụ nanị otu mgbe nye mmehie. Ma ndụ ọ dị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.[11] Ya mere, gụọ onwe gị ugbu a dị ka onye nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dị ka onye dị ndụ nꞌebe Chineke nọ, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.[12] Ekwela ka mmehie na-achị anụ ahụ gị ọzọ, enyekwala onwe gị nꞌaka mmehie imezu agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị.[13] Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.[14] O kwesikwaghị ka ị bụrụ odibo mmehie ọzọ, nꞌihi na ugbu a ị nọkwaghị nꞌokpuru iwu, kama ị nọ nꞌokpuru amara.[15] Ka m jụọ gị ajụjụ. Ò ziri ezi na anyị ga-anọgide na-eme mmehie ebe anyị nọ ugbu a nꞌokpuru amara Chineke? Mba! Chineke ekwela.[16] Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi.[17] Ekele dịrị Chineke nꞌihi na mbụ unu jiri aka unu họrọ ịbụ ohu mmehie, ma ugbu a, unu ekpebiela ịnabatara onwe unu ozizi ahụ Chineke nyefere nꞌaka unu.[18] Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site nꞌaka nna unu ukwu ochie bụ mmehie, unu abụrụla ndị ohu nke nna unu ukwu ọhụrụ, bụ ezi omume.[19] Eji m odibo na nna ya ukwu na-amara unu atụ nꞌihi na ọ ga-eme ka unu ghọta ihe m na-ekwu. Ya mere, dị ka unu si rubere mmehie isi, rụọ ọrụ ọjọọ nile ọ chọrọ na mbụ, sitekwanụ otu a jeere Chineke ozi, ịrụpụta ihe nile dị mma, na ihe dị nsọ na ndụ unu.[20] Na mgbe ochie ahụ, mgbe unu bụ odibo mmehie, ọ naghị agụ unu agụụ ime ihe ọ bụla dị mma.[21] Ma gịnị bụ uru unu nwetara nꞌọrụ ahụ nile unu rụrụ? Amaara m na ọ dịghị uru ọ bụla unu ritere. Nꞌihi na leenụ otu ihere si eme unu, mgbe ọ bụla unu chetara ndụ ochie unu ahụ. Unu makwaara na ọgwụgwụ ihe ndị ahụ nile bụ ọnwụ.[22] Ma ugbu a, ụmụnna m, unu abụkwaghị ohu mmehie, kama unu bụ ohu Chineke. Uru Chineke kwadoro na unu ga-erita nꞌọnọdụ ọhụrụ a, bụ ịdị nsọ na ndụ ebighị ebi.[23] Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

MATIU 19:1-30
[1] Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judia, nke dị ma a gafee osimiri Jọdan.[2] Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha.[3] Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”[4] Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.[5] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’[6] Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”[7] Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?”[8] Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.[9] Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”[10] Ndị na-eso ụzọ Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwụnye ma ọlị.”[11] Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ nile ga-anagide okwu a. Nanị ndị Chineke nyere ike ime ya ga-anagide ya.[12] Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”[13] Mgbe ahụ e kuteere Jisọs ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba sị, “Unu esogbula Onyenwe anyị.”[14] Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”[15] Jisọs bikwasịrị ha aka nꞌisi gọzie ha nile tupuu ọ hapụ ha pụọ.[16] Otu nwoke bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”[17] Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.”[18] Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.[19] Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”[20] Nwoke ahụ sịrị ya, “Iwu ndị a ka m deberela siterị na mgbe m dị na nwanta. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”[21] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.”[22] Mgbe nwoke ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ọ lara na mwute, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya.[23] Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke.[24] Nꞌezie asị m unu, ọ dịrị inyinya mfe ịgafe nꞌanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nꞌalaeze Chineke.”[25] Okwu a Jisọs kwuru mere ka egwu tụọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”[26] Jisọs legidere ha anya sị ha, “E jiri anya mmadụ lee ya ọ bụ ihe siri ike. Ma nꞌebe Chineke nọ ọ dịghị ihe rara ya ahụ ime.”[27] Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe nile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?”[28] Jisọs zara sị ya, “Mgbe mụ bụ nwa nke mmadụ ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze ebube m, nꞌalaeze ahụ, nꞌezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ Izirel ikpe.[29] Onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nna ya na nne ya, na nwụnye ya, na ụmụntakịrị ya, ma ọ bụ ala o nwere, soro m, ga-anata ụgwọ ọrụ karịrị ihe ọ hapụrụ. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.[30] Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ bido ugbu a, ga-abụ ndị ikpeazụ.”

Igbo Bible 1988
No Data