A A A A A

Ndụ: [Mmega]


LUK 22:25
Jisọs gwara ha okwu sị, “Ndị eze mba dị nꞌụwa na-eji aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha. Otu aka ahụ kwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.

NKPUGHE 13:12
E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.

MATIU 20:25
Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara ọ gwara ha okwu sị, “Nꞌetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndị isi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nꞌuche. Ndị ukwu nꞌetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha.

MAK 10:42
Ma Jisọs kpọkọtara ha nile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze ụwa a, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike achị ndị nọ nꞌokpuru ha.

KỌLỌSI 2:23
Ọ bụ ezie na iwu ndị a na-adị ka ihe dị mma, nꞌihi na onye na-edebe ha kwesịrị itunyezi uche ya idebe ha, bụrụkwa ihe na-ewetara mmadụ obi umeala na ihe na-enye ahụ anyị ahụhụ, ma o nweghị uru ha bara nꞌihe gbasara inwe mmeri nꞌebe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ mmadụ dị. Ihe iwu a na-eme bụ nanị ime ka mmadụ na-afụli onwe ya elu.

HIBRU 5:14
Nri dị ike dị ka ụtara dịrị ndị Kraịst katara ahụ. Anyị chọrọ dimkpa nꞌokwu Chineke. Ha pụrụ ịmata ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ajọ ihe.

1 PITA 5:2
Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.

MATIU 8:9
Dị ka ọchịagha nke m bụ, ọ bụrụ na m asị onye agha nọ nꞌokpuru m bịa, ọ na-abịa, nꞌihi na ọ nọ nꞌokpuru m. Ma i nwere ike karịrị nke a ịchụpụ ọrịa ahụ na-enye ohu m nsogbu.”

1 TIMỌTI 4:8
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

1 KỌRINT 10:31
Ka m gwa gị ihe mere o ji dị mkpa. I kwesịrị ime ihe ọ bụla ị na-eme, ma ọ bụ iri nri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, i kwesịrị ime ihe nile nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Chineke otuto.

2 TIMỌTI 2:5
Na-eso ụkpụrụ Onyenwe anyị nꞌọrụ ị na-arụrụ ya, dị ka onye na-agba ọsọ si eso iwu nile e mere maka ịgba ọsọ, si otu a nata onyinye. Ma onye na-esoghị iwu ndị a anaghị anata onyinye ọ bụla.

1 TIMỌTI 2:12
Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.

ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.

ỌLU OZI 24:16
Nꞌihi nke a ka m ji na-agbalị mgbe nile ibi obi dị ọcha nꞌihu Chineke na mmadụ.

1 TIMỌTI 4:7
Atụfula oge gị ịrụ ụka banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama jiri oge i nwere na ike i nwere na-azụ onwe gị.

HIBRU 12:2-11
[2] Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.[3] Na-atụgharịnụ uche nꞌihe banyere Jisọs oge nile. Tụgharịanụ uche banyere mmeso o mesoro ndị mmehie ahụ megidere ya. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịda mba nꞌọsọ unu na-agba.[4] Chetanụ na mmadụ ọ bụla anwụbeghị nꞌetiti unu nꞌihi ọgụ nke unu na-alụso mmehie.[5] Unu echefuola ihe akwụwkọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka Chineke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ sị: “Nwa m ewela iwe mgbe Chineke na-apịa gị ụtarị. Adala mba mgbe ọ na-egosi gị ụzọ i siri mejọọ.[6] Nꞌihi na onye Chineke hụrụ nꞌanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”[7] Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.[8] Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba.[9] Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.[10] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya.[11] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.

1 PITA 2:14
Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe.

1 PITA 2:1
Ya mere, sitenụ nꞌajọ omume unu pụta, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ekwutọ mmadụ ihe ha.

1 KỌRINT 6:19
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.

3 JỌN 1:2
Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma.

1 KỌRINT 9:24-27
[24] Unu maara na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ, nꞌoge a na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ otu onye nanị na-enwe ihe onyinye nke mbụ. Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta ụdị onyinye ahụ.[25] Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.[26] Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.[27] Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

1 PITA 3:3-4
[3] Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla.[4] Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.

2 TIMỌTI 4:7
Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike.

1 KỌRINT 9:26-27
[26] Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.[27] Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

Igbo Bible 1988
No Data