A A A A A

Ndụ: [Nghọta]


1 KỌRINT 2:14
Ma mmadụ ahụ mkpụrụ obi nke onwe ya na-achị enweghị ike ịnabatara onwe ya onyinye si nꞌaka Mmụọ Nsọ Chineke, nꞌihi na onye dị otu a adighị aghọta ihe ha bụ. Nꞌebe ọ nọ, ha bụ ihe nzuzu. Kama ọ bụ nanị ndị Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha na-aghọta ihe ọ bụla banyere Mmụọ Nsọ.

1 KỌRINT 12:10
Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.

1 KỌRINT 14:29-33
[29] Ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nꞌotu nꞌotu, mgbe mmadụ nile nọrọ nwayọọ na-ege ha ntị.[30] Ọ bụrụ na onye ọzọ anata ozi site nꞌaka Chineke, mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu, ka onye ahụ natara ozi ahụ chere tutuu onye nke na-ekwu ekwuchaa tupuu o kwuo nke ya.[31] Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi.[32] Chetanụ na onye ahụ Chineke chọrọ isite nꞌọnụ ya kwuo okwu nwere ike iji ndidi chere ruo mgbe o ruru oge nke ya ikwu okwu.[33] Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya.

1 JỌN 2:27
Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta.

1 JỌN 4:1
Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile.

1 TESALỌNAIKA 5:21
Kama nwapụtanụ ihe nile ịchọpụta ma ha bụ ọchịchọ Chineke. Ha bụrụ ọchịchọ ya jidesienụ ihe nile ahụ ziri ezi aka nke ọma.

1 TIMỌTI 4:1
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.

KỌLỌSI 2:8
Ekwelanụ ka onye ọ bụla jiri okwu amamihe nke ụwa mebie ọṅụ unu, na okwukwe unu, okwu amamihe ahụ nke ọsịsa ya nile dabeere nꞌechiche na ntụpụta mmadụ, kama ịdabere nꞌihe Kraịst kwuru.

HIBRU 4:12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

HIBRU 5:14
Nri dị ike dị ka ụtara dịrị ndị Kraịst katara ahụ. Anyị chọrọ dimkpa nꞌokwu Chineke. Ha pụrụ ịmata ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ajọ ihe.

JEMES 1:5
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.

JỌN 7:24
Kpeenụ ikpe ziri ezi ụnu ekpela ikpe site nanị nꞌihe anya naahụ.”

MATIU 10:16
“Ana m ezipụ unu dị ka a ga-asị na ọ bụ atụrụ ka m na-ezipụ nꞌetiti agụ. Nweenụ uche dị ka agwọ.

MATIU 24:24
Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara.

ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

ỌLU OZI 17:10-11
[10] Ma nꞌabalị ahụ ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Sailas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nꞌebe ahụ, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, na-ekwusa ozi ọma Chineke.[11] Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu Chineke karịa ndị bi na Tesalonaịka. Mgbe ha gere ntị nꞌokwu Chineke, ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Sailas na-ezi ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị nile.

FILIPAI 1:9-10
[9] Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji na-ekpesi ekpere ike, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-aba ụba. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nꞌinwe mmazu na nghọta nke eziokwu ahụ.[10] Ka unu si otu a bụrụ ndị na-enwe nghọta banyere ihe dị iche nꞌetiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka unu bụrụkwa ndị dị ọcha nꞌobi unu, ndị onye ọ bụla na-agaghị enwe ihe ọjọọ ha ga-ekwu megide unu, tutuu ruo ụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi.

1 TIMỌTI 6:3-5
[3] Ụfọdụ mmadụ nwere ike ịjụ ịnabata okwu ndị a, ma ha bụ ezi ozizi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụrụkwa ntọ ala nke ezi ndụ.[4] Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche.[5] Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị.

2 KỌRINT 11:13-15
[13] Nꞌihi na ndị dị otu a abụghị ndị ozi nꞌezie. Ha bụ ndị ụgha, ndị ghọgburu unu ime ka unu chee na ha bụ ndị ozi Kraịst.[14] Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.[15] Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ekwensu ozi emee onwe ha dị ka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nꞌọgwụgwụ oge, ha ga-anata ịta ahụhụ dị ukwuu nꞌihi ajọ ọrụ ha rụrụ.

Igbo Bible 1988
No Data