A A A A A

Ndụ: [Ka nká]


1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

2 KỌRINT 4:16
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.

FAILIMON ๑:๙
Kama ọ kaara m mma ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Jisọs Kraịst na-arịọ gị arịrịọ a.

TAITỌS ๒:๓
Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.

1 TIMỌTI 5:1-2
[1] Abarala okenye mba, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorọbịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nꞌanya okwu.[2] Na-emeso ndị bụ agadi nwanyị omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche dị ọcha banyere ha.

FILIPAI 3:20-21
[20] Ma anyị onwe anyị ụmụnna m, eluigwe bụ ụlọ anyị, ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. Anyị na-elekwa anya mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe lọghachi.[21] Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data