MATIU 6:25-33 |
[25] “Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya.[26] Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha?[27] Ònye nꞌetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nꞌogologo ụbọchị nke ndụ ya site nꞌichegbu onwe ya?[28] “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ Hoge nile maka uwe? Leenụ okoko osisi ọhịa. Ha adịghị echegbu onwe ha maka uwe.[29] Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a.[30] Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta?[31] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?[32] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.[33] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. |
|
2 KỌRINT 11:23-25 |
[23] Ha na-ekwu na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi. Ma mụ onwe m ejerrela Kraịst ozi karịa ha nile (amaara m na ụdị okwu a m na-ekwu bụ ụdị okwu onye isi na-adịghị mma na-ekwu). Ma adọgbuola m onwe m nꞌọrụ karịa ha nile. Etinyela m nꞌụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe nꞌihi ikwusa ozi ọma. Etiela m ihe otiti ọtụtụ mgbe. Mgbe mgbe kwa anọọla m nꞌọnụ ọnwụ.[24] Ndị Juu apịala m ọnụ ụtarị iri atọ na toolu ha ugbo ise.[25] E jirila okporo igwe tie m ihe ruru ugboro atọ. A tụọla m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nꞌime ya kpuru nꞌoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nꞌelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. |
|
FILIPAI 4:12-13 |
[12] Amụtala m otu m ga-esi nọọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ mgbe m na-anọ agụụ, ma ọ bụ mgbe m rijuru afọ ma ọ bụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu ma ọ bụ nꞌoge ụkọ.[13] Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike. |
|
HIBRU 13:5 |
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.” |
|
1 TIMỌTI 6:6-7 |
[6] Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe.[7] Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ. |
|
LUK 12:15 |
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Kpachapụnụ anya, nꞌihi na ndụ mmadụ adabereghị nanị nꞌihe o nwere, ma ọ bụ otu onye ahụ siri baa ụba.” |
|
2 KỌRINT 12:10 |
Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike. |
|
1 TIMỌTI 6:10-11 |
[10] Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju.[11] Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |