A A A A A

Ezigbo agwa: [Nkwenye]


1 JỌN 4:17
Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya.

1 JỌN 5:14
Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị.

EFESỌS 3:12
Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.

HIBRU 4:16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.

FILIPAI 1:6
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

FILIPAI 3:3-5
[3] Nꞌihi na obibi ugwu nke elu ahụ abụghị ihe dị mkpa ime anyị ụmụ Chineke. Kama ọ bụ iji mmụọ anyị na-efe Chineke. Nke a bụkwa ihe bụ ezigbo obibi ugwu. Anyị bụ ndị Kraịst na-anya isi nꞌihe ahụ Kraịst Jisọs meere anyị, anyị ghọtakwara na anyị enweghị ike ọ bụla ịzọpụta onwe anyị.[4] A sị na e nwere otu onye pụrụ ịnya isi na o nwere ike ịzọpụta onwe ya, onye ahụ gaara abụ mụ onwe m. A sị na ndị ọzọ na-eche na a ga-azọpụta ha nꞌihi ihe ha bụ, a gaara azọpụtakwa m nꞌihi ihe m bụ.[5] Nꞌihi na a mụrụ m nꞌezinụlọ ndị Juu, ezinụlọ si nꞌagbụrụ Benjamin pụta. E biri m ugwu nꞌụbọchị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, nke mere ka m bụrụ onye Juu nꞌezie. Karịsịa, eso m nꞌotu ndị Farisii, ndị ahụ ọ na-anụ ọkụ nꞌobi idebe iwu nile na omenala nile ndị Juu nwere.

2 KỌRINT 3:1-4
[1] Okwu ndị a nile anyị na-ekwu o gosiri na anyị na-anya isi nꞌime onwe anyị? Dị ka ndị ọzọ na-eme, ọ̀ dị anyị mkpa iwetara unu akwụkwọ nke ga-akọwa ụdị mmadụ anyị bụ? Ka ọ̀ dị mkpa ka anyị rịọọ unu ka unu nye anyị akwụ-kwọ nke ga-ezi ndị ọzọ ịma mma anyị?[2] Nꞌezie, akwụkwọ ọ bụla adịghị anyị mkpa, nꞌihi na unu onwe unu bụ akwụkwọ e dere iji kọwaa ụdị mmadụ anyị bụ nke mmadụ nile nwere ike ịhụ na ịgụ. Nꞌihi na mgbe ndị mmadụ hụrụ mgbanwe dị na ndụ unu, ha ga-ahụ ọrụ ọma anyị rụrụ nꞌetiti unu.[3] Ọ pụtara ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi si nꞌebe Kraịst nọ bịa, nke anyị dere. Ọ bụghị ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee na mbadamba nkume, kama e dere ya nꞌobi mmadụ site na mmụọ Chineke na-adị ndụ.[4] Anyị pụrụ ikwu ụdị okwu a banyere onwe anyị nꞌihi na anyị nwere ntụkwasị obi nꞌime Chineke site na Kraịst, na ọ ga-enyere anyị aka iguzosi ike nꞌeziokwu ahụ anyị na-ekwu.

Igbo Bible 1988
No Data