1 JỌN 4:20 |
Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya? |
|
2 TIMỌTI 1:12 |
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji naahụ ahụhụ ndị a nꞌime ụlọ mkpọrọ nꞌebe a, ma nꞌeziokwu, ihere adịghị eme m, nꞌihi na amaara m onye m naatụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe nile m nyere ya nꞌaka idebe tutuu ruo ụbọchị ahụ ọ ga-alọghachi. |
|
2 TIMỌTI 2:15 |
Na-arụsị ọrụ gị ike ka ị bụrụ onye Chineke ga-agwa okwu sị, “Ị meela nke ọma.” Bụrụ onye naarụ ọrụ ọma, onye ihere na-apụghị ime mgbe Chineke ga-enyocha ọrụ gị. Mara ihe okwu Chineke na-ekwu, matakwa otu e si akọwa ya. |
|
2 TIMỌTI 4:7 |
Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike. |
|
ỌLU OZI 2:42 |
Ha jiri oge nile ha nwere na-anụ ihe ndị ozi Kraịst na-ezi ha. Ha kenyere ndị ọzọ ihe ha nwere. |
|
KỌLỌSI 1:29 |
Nke a bụ ọrụ m na-arụ. Ana m arụkwa ya nꞌihi ike dị ukwuu nke na-arụkwa ọrụ nꞌime m. |
|
GALETIA 1:4 |
Ọ bụ Kraịst nwụrụ nꞌihi mmehie anyị dị ka Chineke Nna zubere na ọ ga-anwụ, ịgbapụta anyị site nꞌụwa ọjọọ a, nke anyị bi nꞌime ya. |
|
GALETIA 6:9 |
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba. |
|
JỌN 8:12 |
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Mụ onwe m bụ onye na-enye ndị bi nꞌụwa ìhè. Onye ọ bụla sooro m agaghị ejegharị nꞌime ọchịchịrị, kama ìhè ahụ ga-anọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi.” |
|
JỌN 9:62 |
Ma ndị ọzọ kwuru sị, “Ọ dịghị ekwu okwu dị ka onye mmụọ ọjọọ na-achị. Mmụọ ọjọọ enweghị ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee.” |
|
MATIU 4:19 |
Jisọs sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” |
|
FILIPAI 3:13 |
Ụmụnna m, nꞌezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesịrị ịbụ. Ma ihe m ji ike m nile na-eme bụ ichefu ihe nile gara aga, na ilekwasị anya nꞌihe ahụ m na-agbaso dị m nꞌihu. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |