A A A A A

Ezigbo agwa: [Dị ọcha]


1 JỌN 1:7-9
[7] Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nꞌihè, dị ka ya onwe ya si nọọ nꞌihè na-ebi ndụ ya, mgbe ahụ anyị na ibe anyị ga-enwe ezi nnwekọ. Jisọs Ọkpara Chineke ga-asachapụkwa anyị site na mmehie anyị nile.[8] Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eme onwe anyị ndị nzuzu. Anyị na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ Chineke na-ekwu banyere ndụ anyị.[9] Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

ỌLU OZI 9:1-31
[1] Ugbu a, Sọl, onye ume nile ọ na-ekupụta bụ nanị ịba mba na ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi, gara hụ onyeisi nchụaja na Jerusalem.[2] Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ.[3] Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu.[4] Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?”[5] Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu![6] Bilie, baa nꞌime obodo. Nọdụ nꞌebe ahụ tutuu ruo mgbe ị natara ozi m.”[7] Ndị nwoke ha na Sọl so guzoro nꞌebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọ bụla.[8] Sọl biliri ọtọ, chọpụta na ya bụ onye kpuru ìsì. Ndị ya na ha so sekpụụrụ ya nꞌaka tutuu ha abata Damaskọs.[9] Nꞌebe ahụ ka ọ nọrọ abalị atọ, na-ahụghị ụzọ. O rikwaghị nri ọ bụla. Mmiri abakwaghị ya ọnụ.[10] Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.”[11] Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere.[12] Sọl ahụla ọhụ nke gwara ya na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, na ọ ga-ebikwasị aka nꞌisi ya ka ọ hụ ụzọ.”[13] Ma Ananayas zara sị, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ nile nwoke a mere ndị kwere ekwe bi na Jerusalem![14] Ugbu a, anyị nụrụ na ọ natara ike nꞌaka ndị nchụaja ka ọ bịa nꞌebe a jide onye kwere ekwe ọ bụla nọ na Damaskọs!”[15] Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, “Gaa ozi m ziri gị. Nꞌihi na ahọpụtala m Sọl ka o were ozi ọma m gaa mba nile, ma nꞌihu ndị eze, ma nꞌihu ụmụ Izirel.[16] Nꞌihi na aga m egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịhụ nꞌihi m.”[17] Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”[18] Otu mgbe ahụ, ihe dị ka akpịrịkpa sitere nꞌanya Sọl abụọ dapụta. O bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. Ananayas mekwara ya baptizim.[19] Emesịa, o rituru nri, nweghachikwa ike ya. Ya na ndị kwere ekwe sooro nọdụ na Damaskọs ụbọchị ụfọdụ.[20] Ọ dịghị anya Sọl bidoro ikwusa Kraịst nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ na-ekwusa na Kraịst bụ Ọkpara Chineke.[21] O juru ndị nile nụrụ okwu ya anya. Nꞌihi ya ha na-asị, “Nwoke a ọ̀ bụghị onye ahụ kpagburu ndị kwere ekwe na Jerusalem? Ọ bịakwaghị Damaskọs ijide ndị nile kwere ekwe, ịkpụgara ha ndị isi nchụaja nọ na Jerusalem?”[22] Ma Sọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma! Kama ike ikwusa ozi ọma ya na-aba ụba. Ọ gara nꞌihu imeri ndị Juu site nꞌụzọ o siri gosi ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.[23] Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị Juu gbara izu igbu ya.[24] Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ nile e si apụ obodo ahụ, ka ha gbuo ya.[25] Ndị kwere ekwe nọ na Damaskọs nyeere Sọl aka ịgbapụ. Nꞌotu abalị, ha tinyere ya nꞌime nkata buru ibu, site nꞌoghere dị na mgbidi obodo ahụ wetuo ya nꞌofe nke ọzọ.[26] Site nꞌebe ahụ, Sọl gbapụrụ gaa Jerusalem. Mgbe o ruru Jerusalem, ọ gbalịri ịdịnyere ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ bụrụla onye kwere ekwe dị ka ha onwe ha.[27] Ma Banabas duuru ya gaa nꞌebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu Sọl siri zute Onyenwe anyị nꞌụzọ Damaskọs. Ọ kọkwara ha akụkọ otu Sọl siri kwusaa ozi ọma Kraịst na Damaskọs na-atụghị egwu.[28] Site nꞌoge ahụ, Sọl nọdụrụ na Jerusalem. Ya na ndị kwere ekwe mekọrịtakwara na-enweghị nsogbu ọ bụla.[29] O kwusara okwu nꞌaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtara ụka. Nꞌihi ya ndị a gbara izu igbu ya.[30] Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha mere ngwangwa zipụ Sọl obodo Tasọs.[31] Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba.

FILIPAI 4:8
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.

NKPUGHE 1:5
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.

2 KỌRINT 7:1
Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke.

2 PITA 3:8
Ndị m hụrụ nꞌanya, unu echefula otu okwu a, nꞌanya Chineke, ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti otu ụbọchị na puku ụbọchị. Ha bụ otu ihe nꞌanya ya.

2 KỌRINT 5:17
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.

MATIU 23:25-28
[25] “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nꞌike na ọchịchọ ọjọọ nile.[26] “Gị onye ìsì na-akpọ onwe gị onye Farisii! Buru ụzọ mee ka ime iko na efere gị dị ọcha, mgbe ahụ ha ga-adị ọcha ihu na azụ.[27] “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe mara mma, ma ime ha jupụtara nꞌọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe rere ure nile.[28] Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.

LUK 6:31
Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

MATIU 23:26
“Gị onye ìsì na-akpọ onwe gị onye Farisii! Buru ụzọ mee ka ime iko na efere gị dị ọcha, mgbe ahụ ha ga-adị ọcha ihu na azụ.

MATIU 5:8
Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya.

ROM 5:8
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.

1 TIMỌTI 4:12
Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya nꞌihi na ị bụ okorọbịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịma atụ na ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe. Mee ka ha soro ụzọ i si ezi ihe na ụzọ i si ebi ndụ gị. Bụrụkwa ihe ịma atụ nye ha, ma ọ bụ ihe ilere anya nꞌime okwukwe gị, na ịhụnanya gị, na iche uche zuru oke gị.

2 KỌRINT 6:14-18
[14] Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọ bụla. Nꞌihi na gịnị ka ezi omume na ihe ọjọọ nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?[15] Ọ̀ bụ nnwekọ dị aṅaa dị na-agbata onye Kraịst na ekwensu? Gịnị kwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?[16] Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọ nsọ Chineke na arụsị? Nꞌihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kwuru sị, “M ga-ebi nꞌime ha, jegharịakwa nꞌime ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”[17] Ọ bụ nke a mere Chineke ji kwuo sị, “Sinụ nꞌetiti ha pụta, wezuganụ onwe unu nꞌebe ha nọ. Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka, mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.[18] Mụ onwe m ga-abụ Nna unu, unu onwe unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ndị nwanyị.”

ỌLU OZI 9:1-20
[1] Ugbu a, Sọl, onye ume nile ọ na-ekupụta bụ nanị ịba mba na ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi, gara hụ onyeisi nchụaja na Jerusalem.[2] Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ.[3] Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu.[4] Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?”[5] Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu![6] Bilie, baa nꞌime obodo. Nọdụ nꞌebe ahụ tutuu ruo mgbe ị natara ozi m.”[7] Ndị nwoke ha na Sọl so guzoro nꞌebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọ bụla.[8] Sọl biliri ọtọ, chọpụta na ya bụ onye kpuru ìsì. Ndị ya na ha so sekpụụrụ ya nꞌaka tutuu ha abata Damaskọs.[9] Nꞌebe ahụ ka ọ nọrọ abalị atọ, na-ahụghị ụzọ. O rikwaghị nri ọ bụla. Mmiri abakwaghị ya ọnụ.[10] Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.”[11] Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere.[12] Sọl ahụla ọhụ nke gwara ya na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, na ọ ga-ebikwasị aka nꞌisi ya ka ọ hụ ụzọ.”[13] Ma Ananayas zara sị, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ nile nwoke a mere ndị kwere ekwe bi na Jerusalem![14] Ugbu a, anyị nụrụ na ọ natara ike nꞌaka ndị nchụaja ka ọ bịa nꞌebe a jide onye kwere ekwe ọ bụla nọ na Damaskọs!”[15] Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, “Gaa ozi m ziri gị. Nꞌihi na ahọpụtala m Sọl ka o were ozi ọma m gaa mba nile, ma nꞌihu ndị eze, ma nꞌihu ụmụ Izirel.[16] Nꞌihi na aga m egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịhụ nꞌihi m.”[17] Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”[18] Otu mgbe ahụ, ihe dị ka akpịrịkpa sitere nꞌanya Sọl abụọ dapụta. O bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. Ananayas mekwara ya baptizim.[19] Emesịa, o rituru nri, nweghachikwa ike ya. Ya na ndị kwere ekwe sooro nọdụ na Damaskọs ụbọchị ụfọdụ.[20] Ọ dịghị anya Sọl bidoro ikwusa Kraịst nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ na-ekwusa na Kraịst bụ Ọkpara Chineke.

1 KỌRINT 15:29
Ọ bụrụ na mbilite nꞌọnwụ adịghị, ọ̀ bara uru ime ndị mmadụ baptizim nꞌaha ndị nwụrụ anwụ? Gịnị mere e ji mee ha baptizim ma ọ bụrụ na ha enweghị olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-emesị bilie dị ndụ ọzọ?

ROM 1:26-27
[26] Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.[27] Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.

1 KỌRINT ๑๔:๔๐
Ma meenụ ihe nile nꞌụzọ dị mma, ka ha dịkwa nꞌusoro.

MATIU 7:18-23
[18] Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma.[19] Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ.[20] Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya.[21] “Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.[22] Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’[23] Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ.

JỌN 5:39-40
[39] “Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nꞌihi na unu chere na unu ga-esite nꞌihe e dere nꞌime ya nwee ndụ ebighị ebi. Ma akwụkwọ nsọ ndị a na-ekwu ihe banyere m.[40] Ma unu achọghị ịbịakwute m ka m nye unu ndụ ebighị ebi.

Igbo Bible 1988
No Data