JỌN 10:10 |
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke. |
|
JỌN 14:1 |
“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m. |
|
FILIPAI 4:19 |
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị. |
|
ROM ۸:۲۸ |
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị. |
|
ROM 15:13 |
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu. |
|
1 JỌN 5:14-15 |
[14] Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị.[15] Ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpọkuru ya chee mkpa anyị nꞌihu ya, anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-aza ekpere anyị. |
|
MATIU 6:25-26 |
[25] “Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya.[26] Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha? |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |