A A A A A

Ezigbo agwa: [Njikpa onwe]


1 KỌRINT 9:25
Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

1 TESALỌNAIKA 5:6
Nꞌihi nke a, nọọnụ na nche. Unu arahụkwala ụra dị ka ndị ọzọ. Kama nọọnụ na nche na-ele anya ọbịbịa ya.

2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

TAITỌS 1:8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.

ROM 12:1-2
[1] Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.[2] Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

FILIPAI 4:8-9
[8] Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.[9] Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.

JEMES 1:19-21
[19] Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.[20] Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.[21] Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ nile na ihe ọ bụla dị njọ nke fọdụrụ nꞌime ndụ unu. Nꞌọnọdụ ya nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nꞌobi unu, nke nwere ike ịzọpụta unu.

1 PITA 5:6-8
[6] Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu.[7] Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.[8] Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.

1 KỌRINT 9:24-27
[24] Unu maara na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ, nꞌoge a na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ otu onye nanị na-enwe ihe onyinye nke mbụ. Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta ụdị onyinye ahụ.[25] Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.[26] Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.[27] Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

1 KỌRINT 6:12-20
[12] Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya.[13] Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.[14] Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie.[15] Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela.[16] Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”[17] Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ.[18] Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

2 PITA 1:3-11
[3] Chineke esitela nꞌike ya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa. O nyela anyị ihe ahụ ga-enyere anyị aka ibi ezi ndụ dị ka ndị ma onye Chineke bụ. Nꞌihi na ọ bụ ya kpọrọ anyị site nꞌebube ya na nꞌịdị mma ya.[4] Ọ bụkwa site nꞌike aka ya ka o ji nye anyị onyinye ahụ dị ukwuu, nke o kwere anyị na nkwa. Nkwa o kwere anyị, nke o mezuru, bụ nzọpụta ọ zọpụtara anyị site nꞌagụụ ihe ọjọọ nile, na ndụ rere ure nile dị nꞌụwa, na inye anyị ọdịdị ya onwe ya bụ Chineke.[5] Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,[6] ka anyị si otu a bụrụ ndị nwere ntachi obi na ndị dị nsọ.[7] Mgbe anyị mere nke a, anyị ga-agakwa nꞌihu ime ka ihe gbasara ndị ọzọ na-adị anyị mma. Nke a ga-eme ka ịhụnanya anyị nwere nꞌebe ndị ọzọ nọ baa ụba.[8] Mgbe anyị na-aga nꞌihu na-eme ihe ndị a, mgbe ha jubigakwara oke nꞌime anyị, mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nꞌihe anyị maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.[9] Ma onye ọ bụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nꞌokwukwe ya nọ nꞌọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na Chineke sachapụrụ mmehie ya nile ime ka o bie ndụ dị mma nꞌihu Onyenwe anyị.[10] Nꞌihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike igosi na unu so nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ họpụta. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ dapụ.[11] Chineke ga-emeghekwara unu ụzọ, nye unu ike ịbanye nꞌalaeze ahụ na-adịgide adịgide, bụ alaeze Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.

EFESỌS 6:10-20
[10] Tupu m mechie okwu m, achọrọ m ime ka unu cheta na ịdị ike unu kwesịrị ịbụ site nꞌike dị ukwuu nke Onyenwe anyị, onye nọ nꞌime unu.[11] Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu.[12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.[13] Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha nile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.[14] Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.[15] Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu.[16] Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ.[17] Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.[18] Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile.[19] Kpeekwaranụ m ekpere, ka Chineke tinye nꞌọnụ m okwu ahụ bara uru ọ chọrọ ka m kwuo. Ka m nweekwa ike ịgwa ndị ọzọ banyere Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ịgwa ha ihe omimi ahụ dị nꞌozi ọma.[20] Ọ bụ nꞌihi ozi ọma a m na-ekwusa, ka m ji nọọ nꞌụlọ mkpọrọ. Ma kpeerenụ m ekpere ka m nwee ike ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu, ọ bụladị nꞌụlọ mkpọrọ a, dị ka o si kwesị ekwesị.

GALETIA 5:13-26
[13] Nꞌihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu enweghị onwe unu ime ihe ọjọọ, kama Kraịst mere ka unu nwere onwe unu ime ka unu hụ ibe unu nꞌanya, na ijere ibe unu ozi.[14] Nꞌihi na ọ bụrụ na a chikọtaa iwu nile nꞌotu, ihe iwu nile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nꞌanya dị ka unu si hụ onwe unu nꞌanya.”[15] Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kama ịhụ ha nꞌanya, kpacharanụ anya. Jienụ onwe unu aka ka unu hapụ ịla onwe unu nꞌiyi.[16] Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.[17] Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.[18] Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu.[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.[22] Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na[23] ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.[24] Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe.[25] Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị.[26] Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.

TAITỌS 2:1-15
[1] Ma gị onwe gị Taịtọs, ahapụkwala ịkụzi eziokwu ahụ ya na ịbụ onye Kraịst so.[2] Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.[3] Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.[6] Nꞌotu ụzọ ahụ kwa, gwakwa ụmụ okorọbịa ka ha nwee akọnuche zuru oke.[7] Nꞌebe a ka gị onwe gị ga-abụrụ ha ihe ịma atụ na ihe ilere anya nꞌịrụ ọrụ ọma. Mee ka ihe nile ị na-eme gosi na ị hụrụ eziokwu ahụ nꞌanya, na ị bụkwa onye na-adịghị eji ya egwuri egwu.[8] Hụ na mkparịta ụka gị nile bụ site nꞌuche zuru oke, nke guzokwa ọtọ. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla bịakwutere gị ka gị na ya rụrịtaa ụka laa nꞌihere, nꞌihi enweghị ihe ọ bụla o jidere aka ọ ga-eji kwujọọ gị.[9] Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe nile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu.[10] Gwa ha ka ha hapụ izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Nꞌụzọ dị otu a, ha ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ikwere nꞌOnyenwe anyị na Chineke anyị.[11] Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu.[12] Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile.[13] Ndụ ile anya ọbịbịa ụbọchị ahụ a gọziri agọzi, mgbe a ga-eme ka ebube Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst pụta ìhè.[14] Kraịst bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nꞌihi anyị, ịgbapụta anyị site nꞌajọ omume anyị nile. Ọ bụkwa ya sachara anyị, ime ka anyị bụrụ ndị nke aka ya, ndị dị ọcha, na ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe nile.[15] Na-akụzi ihe ndị a. Werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nꞌihu. Ma ekwekwala ka ha lelịa gị anya.

JEMES 3:1-18
[1] Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie.[2] Ọtụtụ mgbe, na nꞌụzọ dị iche iche, ka anyị na-emehie. Ma onye ọ bụla nke na-adịghị emehie site nꞌikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya aka.[3] Anyị nwere ike ime ka inyinya mee ihe anyị chọrọ ka o mee, ma ọ bụ gaa ebe anyị chọrọ ka ọ gaa, ma ọ bụrụ na anyị etinye eriri igwe nꞌọnụ ya.[4] Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nꞌosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nꞌịtụgharị ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.[5] Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Kwụsịdị chee echiche ụdị ọhia nke icheku ọkụ ntakịrị pụrụ ime ka o nwuru ọkụ.[6] Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị.[7] Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri,[8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya.[9] Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya.[10] Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị![11] Ọ̀ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nꞌotu isi iyi ahụ na-asọpụta?[12] Ụmụnna m, osisi oroma ọ̀ pụrụ ịmụ ube? Ka osisi ube ọ pụrụ ịmịpụta oroma? Nꞌụzọ dị otu a anyị makwaara na mmiri nnu na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ apụghị isite nꞌotu isi iyi asọpụta.[13] Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nꞌibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nꞌobi umeala nke ịnya isi na-adịghị.[14] Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.[15] Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.[16] Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ.[17] Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya.[18] Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ nke ezi omume.

Igbo Bible 1988
No Data