A A A A A

Ezigbo agwa: [Odido nsacha]


2 TESALỌNAIKA 2:13
Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ.

2 TIMỌTI 2:21
Ọ bụrụ na onye ọ bụla edozie onwe ya ọcha hapụ ime mmehie, ọ ga-adị ka efere ndị e ji ọlaedo kpụọ, nke a na-enye nsọpụrụ nꞌụlọ ahụ. Ọ ga-abụkwa onye e doro iche, onye Kraịst doziri iji rụọ ọrụ ọma nile.

ỌLU OZI 26:18
Imeghe anya ha ka ha hụ ọnọdụ ha. Ka ha chegharịa biekwa ndụ nꞌime ìhè nke Chineke, kama ịwagharị nꞌọchịchịrị bụ ụzọ nke ekwensu. Ka ha soro ndị ọzọ nꞌebe nile nata mgbaghara mmehie na nketa nke Chineke na-enye ndị nile a sachapụrụ mmehie na ndị e sitere nꞌokwukwe ha mee ka ha bụrụ ndị Chineke doro iche.’

KỌLỌSI 2:11
Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim.

KỌLỌSI 3:1-5
[1] Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.[2] Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.[3] Nꞌihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nꞌime Chineke site na Kraịst.[4] Mgbe Kraịst, onye ahụ ji ndụ unu nꞌaka ya ga-alọghachi, unu ga-enwukwa dị ka ya, soro ya keta oke nꞌebube ya.[5] Wezuganụ mmehie na ihe ụwa nile na-arụ arụ nꞌime unu. Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ nile dị nꞌime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nꞌịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nꞌihi na anya ukwu bụkwa ikpere arụsị).

EFESỌS 1:13
Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya.

GALETIA 2:20
ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m.

HIBRU 2:11
Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya.

HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.

HIBRU 10:10-14
[10] Ebe ọ bụ na Jisọs mere ihe Chineke chọrọ, anyị abụrụla ndị a sachapụrụ mmehie ha site nꞌịta Jisọs ji onwe ya chụọ nanị otu ugboro.[11] Nꞌọnọdụ usoro ochie ahụ, ndị nchụaja na-eje ozi ha ụbọchị nile. A na-ahụ ha ka ha ji otu ụdị aja ahụ, aja na-apụghị iwepụ mmehie.[12] Ma Jisọs nyere onwe ya dị ka aja nanị otu ugboro. Aja o ji onwe ya chụọ dịkwa ire ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe o mesịrị ọ gara nọdụ ala nꞌaka nri Chineke.[13] Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka Chineke mee ndị iro ya nile ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.[14] Site nꞌotu aja ahụ Kraịst jiri onwe ya chụọ o mere ka ndị ahụ zuo oke ruo mgbe ebighị ebi bụ ndị ahụ a sachapụrụ mmehie ha.

HIBRU 12:10-14
[10] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya.[11] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.[12] Ya mere, setipụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzozie ike nꞌụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.[13] Debe ụkwụ gị nꞌụzọ ziri ezi. Ka ndị na-adịghị ike hụ gị. Ọ bụrụ na ha esoro gị ha ga-adị ike.[14] Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

HIBRU 13:12
Ọ bụ nke a mere Jisọs ji nwụọkwa, ma ọ bụghị nꞌime obodo. Ebe ahụ ka ọbara ya sachapụrụ mmehie anyị.

1 KỌRINT 1:2
Ọ bụ unu ka m na-edetara akwụkwọ a, unu nzukọ Chineke dị na Kọrint, ndị Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke ya, ndị e mekwara ka unu site na Jisọs bụrụ ndị Chineke na-anabata. Anyị na-edekwara unu ndị Kraịst nile nọ nꞌebe nile akwụkwọ a, unu nile bụ ndị na-akpọku aha Jisọs Kraịst, dị ka Onyenwe anyị na Onyenwe unu.

1 KỌRINT 6:11
Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.

1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

1 JỌN 3:9
Onye a mụrụ ọzọ, nke a mụbatara nꞌezinụlọ Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie. Nꞌihi na ndụ Chineke dị nꞌime ya. Ọ pụghị ịnọgide nꞌime mmehie nꞌihi na ndụ ọhụrụ dị nꞌime ya na-achị ya.

1 PITA 1:2
Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu.

1 TESALỌNAIKA 4:3
Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.

1 TESALỌNAIKA 5:23
Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

2 KỌRINT 5:17
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.

1 TESALỌNAIKA 4:3
Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.

1 TESALỌNAIKA 5:23
Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

2 KỌRINT 5:17
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.

2 KỌRINT 12:21
Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.

JỌN 17:17-19
[17] Biko mee ha ka ha dị ọcha dịkwa nsọ site nꞌịnagide ozizi gị nile nꞌihi na ha bụ eziokwu.[18] Dị ka i siri zite m nꞌụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nꞌụwa.[19] Ọ bụkwa nꞌihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ nꞌime eziokwu ahụ.

FILIPAI 1:6
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.

FILIPAI 2:13
Nꞌihi na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ nꞌime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.

ROM 6:6
Nꞌihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kraịst nꞌelu obe, ime ka anụ ahụ mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nꞌiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nꞌịbụ ohu nye mmehie.

ROM 15:16
abụ m onyeozi Kraịst; ọrụ pụrụ iche e nyere m bụ igbasara ndị mba ọzọ ozi ọma, na iche ha nꞌihu Chineke dị ka aja dị ụtọ nke Chineke ga-anabata. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ emeela ka unu bụrụ ndị dị ọcha, ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ.

2 PITA 1:2-4
[2] Ka mara na udo Chineke dịnyere unu na mmaji na mmaji, ụdị udo na amara ya na-esite na mmazu unu maara ya na-abịa.[3] Chineke esitela nꞌike ya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa. O nyela anyị ihe ahụ ga-enyere anyị aka ibi ezi ndụ dị ka ndị ma onye Chineke bụ. Nꞌihi na ọ bụ ya kpọrọ anyị site nꞌebube ya na nꞌịdị mma ya.[4] Ọ bụkwa site nꞌike aka ya ka o ji nye anyị onyinye ahụ dị ukwuu, nke o kwere anyị na nkwa. Nkwa o kwere anyị, nke o mezuru, bụ nzọpụta ọ zọpụtara anyị site nꞌagụụ ihe ọjọọ nile, na ndụ rere ure nile dị nꞌụwa, na inye anyị ọdịdị ya onwe ya bụ Chineke.

1 TESALỌNAIKA 4:3-5
[3] Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.[4] ***[5] Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo.

JỌN 15:1-4
[1] “Mụ onwe m bụ ezi osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye nlekọta ọrụ ubi.[2] Ọ na-egbuda alaka ọ bụla dị nꞌime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-ewewpụ ihe nile naeme ka ọ hapụ ịmi mkpụrụ nke ọma, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.[3] Ugbu a e meela ka unu dịrị ọcha site nꞌokwu nile m gwara unu.[4] Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌime m, mụ onwe m kwa ga-anọgide nꞌime unu. Alaka ọ bụla apụghị ịmị mkpụrụ nꞌọnwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nꞌosisi vaịnị ahụ. Otu a, unu apụkwaghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na mụ onwe m anọghị nꞌime unu.

ROM 6:1-23
[1] Ugbu a, gịnị ọzọ kwa ka anyị gaekwu? Anyị ga-anọgide nꞌime mmehie ka Chineke nọgide na-emere anyị ebere, ma na-agbaghara anyị?[2] Tụfịakwa! Chineke ekwela! Olee otu anyị ga-esi nọgide na mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị.[3] Nꞌihi na unu kwesịrị ịmata, na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtara anyị na ya nꞌọnwụ ya.[4] Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.[5] Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nꞌọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nꞌọnwụ.[6] Nꞌihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kraịst nꞌelu obe, ime ka anụ ahụ mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nꞌiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nꞌịbụ ohu nye mmehie.[7] Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụrụla onye nwere onwe ya site nꞌebe mmehie dị.[8] Ọ bụrụkwa nꞌeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwaara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.[9] Nꞌihi na anyị maara na ebe Chineke mere ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie, Kraịst agaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ ọzọ.[10] Mgbe ọ nwụrụ, ọ nwụrụ nanị otu mgbe nye mmehie. Ma ndụ ọ dị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.[11] Ya mere, gụọ onwe gị ugbu a dị ka onye nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dị ka onye dị ndụ nꞌebe Chineke nọ, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.[12] Ekwela ka mmehie na-achị anụ ahụ gị ọzọ, enyekwala onwe gị nꞌaka mmehie imezu agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị.[13] Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.[14] O kwesikwaghị ka ị bụrụ odibo mmehie ọzọ, nꞌihi na ugbu a ị nọkwaghị nꞌokpuru iwu, kama ị nọ nꞌokpuru amara.[15] Ka m jụọ gị ajụjụ. Ò ziri ezi na anyị ga-anọgide na-eme mmehie ebe anyị nọ ugbu a nꞌokpuru amara Chineke? Mba! Chineke ekwela.[16] Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi.[17] Ekele dịrị Chineke nꞌihi na mbụ unu jiri aka unu họrọ ịbụ ohu mmehie, ma ugbu a, unu ekpebiela ịnabatara onwe unu ozizi ahụ Chineke nyefere nꞌaka unu.[18] Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site nꞌaka nna unu ukwu ochie bụ mmehie, unu abụrụla ndị ohu nke nna unu ukwu ọhụrụ, bụ ezi omume.[19] Eji m odibo na nna ya ukwu na-amara unu atụ nꞌihi na ọ ga-eme ka unu ghọta ihe m na-ekwu. Ya mere, dị ka unu si rubere mmehie isi, rụọ ọrụ ọjọọ nile ọ chọrọ na mbụ, sitekwanụ otu a jeere Chineke ozi, ịrụpụta ihe nile dị mma, na ihe dị nsọ na ndụ unu.[20] Na mgbe ochie ahụ, mgbe unu bụ odibo mmehie, ọ naghị agụ unu agụụ ime ihe ọ bụla dị mma.[21] Ma gịnị bụ uru unu nwetara nꞌọrụ ahụ nile unu rụrụ? Amaara m na ọ dịghị uru ọ bụla unu ritere. Nꞌihi na leenụ otu ihere si eme unu, mgbe ọ bụla unu chetara ndụ ochie unu ahụ. Unu makwaara na ọgwụgwụ ihe ndị ahụ nile bụ ọnwụ.[22] Ma ugbu a, ụmụnna m, unu abụkwaghị ohu mmehie, kama unu bụ ohu Chineke. Uru Chineke kwadoro na unu ga-erita nꞌọnọdụ ọhụrụ a, bụ ịdị nsọ na ndụ ebighị ebi.[23] Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

Igbo Bible 1988
No Data