A A A A A

Ezigbo agwa: [Ndidi]


1 KỌRINT 13:4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.

FILIPAI 4:6
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.

ROM 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike.

EFESỌS 4:2
Bụrụnụ ndị dị umeala nꞌobi, ndị dị nwayọọ na ndị na-enwe ntachi obi oge nile. Sitekwanụ nꞌịhụnanya na-anabatakwa ibe unu ọ bụladị mgbe ha mejọrọ unu.

GALETIA 6:9
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.

LUK 15:11-24
[11] Mgbe ahụ Jisọs kọkwaara ha akụkọ ọzọ sị ha, “E nwere otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.[12] Nwa ya nwoke nke nta bịakwutere nna ya otu ụbọchị sị ya, ‘Nna m, kenye m ugbu a, site nꞌakụ na ụba i nwere, ihe m kwesịrị iketa mgbe i nwụrụ.’ Nna ya kenyere nwa ya ahụ ihe o kwesịrị iketa.[13] “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorọbịa ahụ kwakọtara ihe nile o nwere hapụ ezi nna ya gaa biri nꞌotu obodo dị nnọọ anya. Nꞌebe ahụ, o mefuchara ego nile o nwere na ndụ ọjọọ.[14] Mgbe ọ zụfuchara ego nile o nwere, ụnwụ bidoro nꞌobodo ahụ, nke mere ka nwokorọbịa ahụ bido ịnọ agụụ.[15] Nꞌihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ, onye nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.[16] Ma agụụ gụrụ nwokorọbịa a nke ukwuu, mee ya ka ọ chọọ iri site na nri ọ na-enye ezi, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ ka o rie.[17] “Otu ụbọchị, mgbe ọ nọdụrụ chee echiche banyere ọnọdụ ya, ọ jụrụ onwe ya ajụjụ sị, ‘Nꞌihi gịnị ka m ga-eji nwụọ nꞌagụụ nꞌebe a mgbe nna m nwere ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi, ndị nwere nri na-ezuru ha mapụtakwa?’[18] O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’[19] ***[20] “Mgbe nwokorọbịa a nwere mkpebi a nꞌime onwe ya, ọ hapụrụ obodo ahụ ịlaghachikwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmiko nꞌahụ ya. O si nꞌụlọ ya gbapụta, gaa zute ya, bakụọ ya, kelee ya.[21] “Mgbe ahụ nwokorọbịa ahụ gwara nna ya sị, ‘Nna m, emehiela m megide gị. Emehiekwala m megide Chineke. Ekwesịghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’[22] “Ma nna ya gwara otu onye na-ejere ya ozi sị, ‘Mee ngwangwa weta uwe kachasị mma dị nꞌụlọ bịa yikwasị nwa m uwe ahụ. Gbanyekwa ya ọla nꞌaka, nyekwa ya akpụkpọ ụkwụ ka o yiri,[23] gaakwa kpụpụta otu ehi gbara abụba gbuo ya ka anyị na ndị enyị anyị soro rie.[24] Nꞌihi na nwa m a, ka m gụrụ dị ka onye furu efu. Ma ugbu a a chọtala ya.’ Emesịa, ha bidoro iri na ịṅụ na ịṅụrị ọṅụ.

ROM 8:24-30
[24] A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.[25] Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ.[26] Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.[27] Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ.[28] Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.[29] Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna.[30] Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa.

2 TESALỌNAIKA 1:4-5
[4] Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.[5] Nke a bụ nanị otu ụzọ Chineke si gosi na ihe nile ọ na-eme bụ ihe ziri ezi. Nꞌihi na Chineke na-eji nsogbu ndị a dakwasịrị unu na-akwado unu maka alaeze ya.

HIBRU 11:13-16
[13] Ndị a nile bụ ndị nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ma ha nwụrụ na-ele anya nkwa Chineke kwere ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi nke a, na-aghọtakwa na ha bụ ndị ọbịa nꞌụwa.[14] Nꞌezie, ndị a nile gụrụ onwe ha dị ka ndị ọbịa nꞌụwa lere anya ala ọzọ. Ha na-ejikere maka ụlọ ha dị nꞌeluigwe.[15] Nꞌihi nke a, ha achọghị ile anya nꞌazụ nꞌihe ụwa ha hapụrụ. Ha gaara alaghachi azụ ịchọ ọganihu ụwa. Ma ha dabeere na-ele anya ngọzi sị nꞌeluigwe nke Chineke na-enye.[16] Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe.

ROM 5:2-4
[2] Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya.[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.[4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.

NKPUGHE 6:9-11
[9] Ma mgbe a nyakapụrụ akara nke ise, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja. Nꞌokpuru ebe ịchụ aja ahụ ka m hụrụ mkpụrụ obi ndị nile nwụrụ anwụ nꞌihi ozi ọma nke Chineke na nꞌihi na ha guzosịrị ike ịgba ama nke eziokwu na nke ndụ zuru oke.[10] Ha nile nọ na-eti oke mkpu na-akpọku Onyenwe anyị na-asị ya, “Gị Onyenwe anyị, Onyenwe ihe nile, Onye dị nsọ na Onye eziokwu, ọ̀ bu ruo ole mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nꞌime ya ikpe nꞌihi ajọ omume ha mesoro anyị? Ọ̀ bụ ruo ole mgbe ka ị na-eche ịbọrọ anyị ọbọ nꞌihi ọbara anyị ndị nile bi nꞌime ụwa wufuru?”[11] Nꞌotu oge ahụ, e yikwasịrị ha uwe dị ọcha nꞌotu nꞌotu. A gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge, tutuu ruo mgbe ụmụnna ha a ga-egbu nꞌihi ozi ọma Jisọs Kraịst ga-abịa soro ha dịkọọ ndụ ọzọ.

Igbo Bible 1988
No Data