1 KỌRINT 16:14 |
Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọ bụla unu na-arụ. |
|
1 JỌN 4:8-18 |
[8] Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya.[9] Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ.[10] Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị.[11] Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nꞌanya, anyị kwesịrị ịhụrịta onwe anyị nꞌanya.[12] Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anyạ anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nꞌanya, Chineke na-ebi nꞌime anyị. Ịhụnanya ya kwa na-eto eto nꞌime anyị.[13] O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nꞌime anyị igosi anyị na o bi nꞌime anyị, na anyị bikwa nꞌime ya.[14] Karịsịa, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa nile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa.[15] Chineke bi nꞌime onye ọ bụla kweere, na nꞌime onye bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nꞌime Chineke.[16] Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.[17] Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya.[18] Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie. |
|
JỌN 3:16 |
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. |
|
1 PITA 4:8 |
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. |
|
KỌLỌSI 3:14 |
Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu. |
|
JỌN 13:34-35 |
[34] “Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.[35] Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” |
|
JỌN 15:13 |
Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya. |
|
1 KỌRINT 13:13 |
Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya. |
|
1 JỌN 4:19 |
Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. |
|
1 JỌN 4:7 |
Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |