ROM 14:12 |
Ee, anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nꞌihu Chineke. |
|
ROM 1:20 |
Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke. |
|
JEMES 5:16 |
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya. |
|
ROM 2:12 |
Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo. |
|
LUK 12:47-48 |
[47] Ya mere, odibo ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma jụ ijikere chere nna ya ukwu, ma ọ bụ kpebie ịhapụ ime ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-eti ya ezigbo ihe otiti.[48] “Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka. |
|
1 TESALỌNAIKA 5:11 |
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọ bụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme. |
|
JEMES 4:17 |
Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke. |
|
ROM 4:15 |
Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na iwu nonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Nihi na ebe iwu na-adịghị, mmehie adịkwaghị. |
|
1 TIMỌTI 1:10 |
Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ. |
|
MATIU 12:36 |
Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru. |
|
LUK 12:48 |
“Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka. |
|
EFESỌS 5:21 |
Sọpụrụnụ Chineke site nꞌido onwe unu nꞌokpuru ibe unu. |
|
HIBRU 10:25 |
Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso. |
|
MATIU 12:36-37 |
[36] Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru.[37] Nꞌihi na okwu unu kwuru ka a ga-eji kpee unu ikpe nꞌụbọchị ahụ, igosi unu dị ka ndị ikpe mara, ma ọ bụ dị ka ndị ikpe na-amaghị.” |
|
GALETIA 6:1-2 |
[1] Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?[2] Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị. |
|
HIBRU 10:24 |
Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu. |
|
1 JỌN 2:2 |
Jisọs bụ onye ahụ hụrụ ahụhụ nꞌihi mmehie anyị si otu a mee ka anyị bụrụ ndị nwere ike ịbịakwute Chineke. Ọ bụ Kraịst mere ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị nile, na mmehie ụwa nile. |
|
2 KỌRINT 5:10 |
Nꞌihi na anyị nile ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Kraịst, ka o kpee anyị ikpe. Mgbe ahụ onye ọ bụla nꞌime anyị, nꞌotu nꞌotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nꞌime ụwa si dị. |
|
2 KỌRINT 4:17-18 |
[17] Nꞌihi na nsogbu ndị a anyị na-enwe ugbu a, na-adịgide nanị nwa oge nta. Ma ahụhụ ndị a ga-ewetara anyị ebube na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, nke dị ukwuu karịa nsogbu ndị a.[18] Nꞌihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nꞌihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nꞌihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị nanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. |
|
EFESỌS 4:25 |
Kwụsịnụ ịgha ụgha nye ibe unu. Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, nꞌihi na unu nile bụ ndị e jikọtara nꞌotu nꞌanụ ahụ. |
|
GALETIA 6:2 |
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị. |
|
ỌLU OZI 14:17 |
Ma ọ nọkwa na-agba akaebe banyere onwe ya nꞌime ọgbọ nile, site nꞌọrụ ọma ya nile. Ọ na-enye unu mmiri ozuzo, na mkpụrụ nke ala nꞌoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri nke na-eme ka obi na-atọ unu ụtọ.” |
|
2 KỌRINT 2:6 |
Nꞌihi na ntaramahụhụ unu nile kpebiri nye ya ezuola. |
|
1 KỌRINT 1:10 |
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |