A A A A A

Ezigbo agwa: [Obiọma]


1 KỌRINT 13:4-7
[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.

EFESỌS 4:29
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.

KỌLỌSI 3:12
Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.

EFESỌS 2:7
Chineke mere nke a igosi ịdị ukwuu nke amara ya nꞌọgbọ nile, na igosi obi ọma ya nꞌebe anyị nọ nꞌime Kraịst.

MATIU 5:24
hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.

ROM ๒:๔
Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa?

GALETIA 5:22
Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na

1 PITA ๔:๘
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.

2 PITA 1:5-7
[5] Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,[6] ka anyị si otu a bụrụ ndị nwere ntachi obi na ndị dị nsọ.[7] Mgbe anyị mere nke a, anyị ga-agakwa nꞌihu ime ka ihe gbasara ndị ọzọ na-adị anyị mma. Nke a ga-eme ka ịhụnanya anyị nwere nꞌebe ndị ọzọ nọ baa ụba.

EFESỌS 4:32
Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst.

GALETIA 6:10
Nꞌihi nke a, dị ka anyị si nwee oge, ka anyị na-arụ ezi ọrụ nꞌebe mmadụ nile nọ, ma nke ka nke, ka anyị na-arụ ezi ihe, karịsịa, nꞌebe ụmụnna anyị nꞌime Kraịst nọ.

LUK ๖:๓๕
“Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere.

1 PITA 3:9
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.

ỌLU OZI 28:2
Ndị obodo a nwere ọmiko nꞌahụ anyị. Ha kwanyeere anyị ọkụ nke dị ka ọkụ e ji esi ite, nꞌakụkụ mmiri ahụ iji ịchụrụ anyị oyi na iji sị anyị “Unu abịala.”

2 KỌRINT 6:6
Anyị emeekwala ka unu mata na anyị bụ ndị sitere na ndụ dị ọcha anyị na-ebi, na ezi nghọta anyị ghọtara ozi ọma ahụ, na ogologo ntachi obi na-ejere Chineke ozi. Anyị egosikwala unu na anyị bụ ndị nwere obi ọma, ndị hụrụ unu nꞌanya, na ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ Chineke.

TAITỌS 3:4
Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè,

Igbo Bible 1988
No Data