1 PITA 3:16 |
Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma. |
|
2 KỌRINT 8:21 |
Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị nanị nꞌihu Chineke, kama nꞌihu ndị mmadụ kwa. |
|
JỌN 14:6 |
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. |
|
HIBRU 13:18 |
Kpeerenụ anyị ekpere nꞌihi na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe. Anyị chọkwara ibi ndụ anyị nꞌime nkwanye ugwu nꞌihe nile. |
|
LUK 6:31 |
Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu. |
|
FILIPAI 4:8 |
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |