A A A A A

Ezigbo agwa: [Nsọpụrụ]


1 PITA 2:17
Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị.

ROM 12:10
Hụrịtanụ onwe unu nꞌanya dị ka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụrụkwanụ ibe unu.

1 TIMỌTI 5:17
O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke.

JỌN 5:23
Ka mmadụ nile nye Ọkpara Nna nsọpụrụ dị ka ha si enye Nna. Onye ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna. Nꞌihi na ọ bụ Nna zitere ya.

JỌN 4:44
Dị ka Jisọs si ekwu, “Onye amụma adịghị enwe ugwu nꞌala a mụrụ ya.”

1 TIMỌTI 1:17
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Onye bụ eze nꞌọgbọ nile, onye a na-apụghị ịhụ anya. Chineke na-adịghị anwụ anwụ, Onye nanị ya bụ Chineke. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.

ROM 13:1-7
[1] Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.[2] Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.[3] Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ.[4] Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.[5] Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee.[6] Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ.[7] Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru.

ROM 2:7
Chineke gaenye ndị nile sitere na ntachi obi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide ndụ ebighị ebi.

HIBRU 13:4
Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.

JỌN 12:26
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ijere m ozi, ya so m. Ndị ozi m ga-anọkwa nꞌebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla abụrụ onyeozi m, Nna m ga-asọpụrụ ya.

EFESỌS ६:१-३
[१] Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nꞌihi na nke a bụ ọrụ unu dị ka ndị nke Kraịst. Ọ bụkwa ihe ziri ezi ka unu mee.[२] “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.[३] Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.”

EFESỌS 6:2
“Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.

JỌN 5:22-23
[22] Nna adịghị ekpe mmadụ ọ bụla ikpe. Ọ hapụụrụ Ọkpara Nna ikpe ikpe nile.[23] Ka mmadụ nile nye Ọkpara Nna nsọpụrụ dị ka ha si enye Nna. Onye ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna. Nꞌihi na ọ bụ Nna zitere ya.

MATIU 15:4
Nꞌihi na Chineke nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ ndị mụrụ ya ka a ga-egbu.’

1 TESALỌNAIKA 4:4
***

2 PITA 1:17
Eso m nọdụ nꞌelu ugwu ahụ dị nsọ mgbe Chineke mere ka otuto ya na nsọpụrụ ya pụta ìhè. Eji m ntị m nụrụ mgbe olu ahụ dị ebube si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ nꞌanya nke ukwuu, onye ihe ya dịkwa m ezi mma.”

NKPUGHE 5:12-13
[12] “Nwa atụrụ ahụ e gburu kwesịrị ịnara ike nile, na akụ nile, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ nile, na otuto nile na ngọzi nile!”[13] Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!”

NKPUGHE 7:12
“Amin! Ngọzi na amamihe nile na ekele nile na nkwanye ugwu nile, na ike nile, na ebube nile dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.”

1 KỌRINT ६:२०
Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

EFESỌS 6:2-3
[2] “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.[3] Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.”

NKPUGHE 4:9-11
[9] Mgbe ihe e kere eke anọ ndị ahụ malitere inye onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi otuto nile, na nsọpụrụ nile, na ekele nile,[10] iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nꞌala nꞌihu ya na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adịgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Ha nile nꞌotu nꞌotu na-atụda okpu eze ha nꞌihu ya na-abụ abụ na-asị,[11] “Ọ bụ nanị gị Onyenwe anyị na Chineke anyị kwesịrị ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nꞌihi na ọ bụ gị kere ihe nile, ọ bụkwa site nꞌọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”

MAK 7:1-13
[1] Otu ụbọchị, ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa ịhụ Jisọs.[2] Mgbe ha gbara ya gburugburu, ha hụrụ ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha ji aka na-adịghị ọcha na-eri nri. Ha akwọghị aka tupuu ha erie ihe, dị ka omenala ndị Juu sịrị dị.[3] Ọ bụ omenala ndị Juu, nke ka nke ndị Farisii, na tupuu mmadụ erie ihe, ọ ga-ebu ụzọ kwọọ aka ya. Omenala a bidororị nꞌoge dị anya.[4] Ọ bụrụ na ndị Juu esite nꞌahịa lọta, ha agaghị eri ihe ọ bụla tutuu ha akwọọ aka ha. Ọ dịkwa omenala ọzọ dị iche iche ha nwere dị ka omenala ịsacha iko, ma ọ bụ ịsacha ite na efere.[5] Nꞌihi na ndị na-eso ụzọ Jisọs edebeghị omenala ndị Juu a, ndị Farisii jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị edebe omenala ndị okenye anyị? Gịnị mere ha jiri were aka rụrụ arụ na-eri nri?”[6] Jisọs zara sị ha, “Okwu ahụ Aịzaya kwuru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, ‘Ndị a ji ire dị ụtọ na-ekwu okwu banyere m, ma nꞌime obi ha, ha ahụghị m nꞌanya.[7] Ofufe ha na-efe m esiteghị nꞌobi ha pụta. Ihe ha na-ezikwa ndị mmadụ abụghị iwu m, kama ọ bụ iwu nke aka ha, nke ha chepụtara nꞌụche ha.’[8] Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa omenala unu ike.”[9] Mgbe ahụ Jisọs gwakwara ha okwu sị, “Ihe unu na-eme bụ iwezụga iwu Chineke ka unu were omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya.[10] Dị ka ịma atụ, Mosisi nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ nne ya na nna ya ga-anwụ.’[11] Ma unu na-ewezụga iwu Chineke a mgbe unu na-ezi ndị mmadụ sị, Ọ̀ bụ ihe ziri ezi ka mmadụ ọ bụla gwa nne ya na nna ya mkpa na-akpa sị, ‘Lee, ego nile m nwere ugbu a bụ nke Chineke. Enweghị m ihe ọ bụla m ga-enye unu.’[12] Nꞌụzọ dị otu a unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka nꞌọnọdụ mkpa ha.[13] Nꞌụzọ dị otu a kwa, unu na-ewezụga iwu Chineke were omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya. Ọ dịkwa ọtụtụ ụzọ ọzọ unu si ewezụga iwu Chineke ma na-ewerekwa omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya.”

MATIU 15:1-9
[1] Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị Juu si Jerusalem bịara ịjụ Jisọs ajụjụ.[2] Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nꞌomenala ndị okenye anyị? Tupuu mmadụ erie nri, ọ bụ omenala anyị na onye ahụ ga-ebu ụzọ kwọọ aka. Ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme nke a.”[3] Jisọs zara ha sị, “Gịnị mekwaranụ unu ji na-emebi iwu Chineke nꞌihi omenala unu?[4] Nꞌihi na Chineke nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ ndị mụrụ ya ka a ga-egbu.’[5] Ma nꞌọnọdụ iwu a, unu na-ezi ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee ihe ọ ga-eji nyere ndị mụrụ ya aka, onye ahụ nwere ike ịjụ inyere ha aka ma ọ bụrụ na o kwuo na ihe ọ bụla o nwere bụ nke Chineke.’[6] Nꞌọmenala unu onye mere ihe dị otu a mere ihe ziri ezi, mgbe ọ jụrụ iji ihe o nwere sọpụrụ ndị mụrụ ya. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ̀ bụghị na unu emeela ka iwu Chineke bụrụ ihe dị ala karịa omenala unu?[7] “Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị,[8] ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ.[9] Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ”

LUK 14:7-8
[7] Mgbe Jisọs hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri ahụ si họrọ nanị oche dị mkpa, oche dị mkpa, ọ gwara ha okwu a nꞌilu sị.[8] “Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị.

2 KỌRINT 6:8
Ụfọdụ mmadụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu.

NKPUGHE 5:13
Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!”

NKPUGHE 4:11
“Ọ bụ nanị gị Onyenwe anyị na Chineke anyị kwesịrị ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nꞌihi na ọ bụ gị kere ihe nile, ọ bụkwa site nꞌọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”

1 TIMỌTI 6:16
Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin.

HIBRU 5:4
Mmadụ ọ bụla apụghị ime onwe ya onye nchụaja. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime mmadụ ka ọ bụrụ onye nchụaja. Cheta na ọ bụ Chineke mere Erọọn ka ọ bụrụ onye nchụaja.

MATIU 15:8
‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ.

MATIU 19:19
Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”

LUK 18:20
Ma otu ọ dị banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe iwu na-ekwu. Ọ sị, ‘Akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”

MATIU 13:57
Iwe were ha nꞌebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma a dịghị asọpụrụ ya nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya.”

MAK 6:4
Ma Jisọs zara ha sị, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọ bụla nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya na nꞌezinụlọ o siri pụta.”

JỌN 12:23-26
[23] Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Oge ahụ abịala mgbe a ga-ebuli Nwa nke mmadụ elu.[24] Eziokwu ka m na-agwa unu. Mkpụrụ ọka apụghị ịmị mkpụrụ karịakwa ma ọ dabara nꞌala nwụọ. Ma o meghị otu a ọ pụghị ịmị mkpụrụ. Kama ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị mkpụrụ hie nne.[25] Onye ọ bụla hụrụ ndụ ya nꞌanya ga-etufu ya. Onye ọ bụla kpọrọ ndụ ya asị nꞌụwa a, gaedebe ya ruo ebighị ebi.[26] “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ijere m ozi, ya so m. Ndị ozi m ga-anọkwa nꞌebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla abụrụ onyeozi m, Nna m ga-asọpụrụ ya.

HIBRU 2:9
Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.

1 TIMỌTI 5:3
O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya.

1 TIMỌTI 6:1
O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a.

Igbo Bible 1988
No Data