2 KỌRINT 8:21 |
Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị nanị nꞌihu Chineke, kama nꞌihu ndị mmadụ kwa. |
|
2 TIMỌTI 2:15 |
Na-arụsị ọrụ gị ike ka ị bụrụ onye Chineke ga-agwa okwu sị, “Ị meela nke ọma.” Bụrụ onye naarụ ọrụ ọma, onye ihere na-apụghị ime mgbe Chineke ga-enyocha ọrụ gị. Mara ihe okwu Chineke na-ekwu, matakwa otu e si akọwa ya. |
|
KỌLỌSI 3:9 |
Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nꞌihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. |
|
EFESỌS 4:25 |
Kwụsịnụ ịgha ụgha nye ibe unu. Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, nꞌihi na unu nile bụ ndị e jikọtara nꞌotu nꞌanụ ahụ. |
|
JEMES 1:26 |
Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. |
|
JEMES 3:17 |
Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya. |
|
LUK 6:31 |
Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu. |
|
MATIU 5:8 |
Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya. |
|
JỌN 1:3 |
E kere ihe nile site nꞌaka ya. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla e kere eke nke a na-ekeghị site nꞌaka ya. |
|
JỌN 3:18 |
“Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke. |
|
FILIPAI 4:8-9 |
[8] Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.[9] Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu. |
|
1 PITA 3:10-12 |
[10] Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha.[11] Ya sitekwa nꞌajọ omume ya tụgharịa bido ime ezi ihe. Ya gbalịakwa ibi ndụ udo, ma na-agbasokwa ndụ udo.[12] Nꞌihi na Chineke si nꞌelu na-ele ndị ezi omume anya mgbe nile, ọ na-egekwa ntị nꞌekpere ha, ma ọ na-ele ndị ajọ omume anya ọjọọ.” |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |