A A A A A

Ezigbo agwa: [Ala / Obi Umeala]


KỌLỌSI 3:12
Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.

EFESỌS 4:2
Bụrụnụ ndị dị umeala nꞌobi, ndị dị nwayọọ na ndị na-enwe ntachi obi oge nile. Sitekwanụ nꞌịhụnanya na-anabatakwa ibe unu ọ bụladị mgbe ha mejọrọ unu.

JEMES 4:6-10
[6] Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.”[7] Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ.[8] Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.[9] Ruonụ uju, tienụ aka nꞌobi nꞌọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru uju werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ ọ bụla dị nꞌime unu.[10] Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu.

1 PITA 5:5
Nꞌotu aka ahụ, unu ụmụ okorọbịa, doonu onwe unu nꞌokpuru ndị bụ okenye. Unu nile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nꞌihi na Chineke na-enye onye dị umeala nꞌobi amara na ngọzi ya, ma onye mpako ka ọ na-eguzo imegide.

LUK 14:11
Onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

ROM 12:3
Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha.

ROM 12:16
Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile.

2 KỌRINT 12:9-10
[9] Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.[10] Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.

FILIPAI 2:3-4
[3] Echela echiche nanị banyere ọdịmma nke gị, ebila ndụ nꞌụzọ ịdọtara onwe gị otuto ndị ọzọ. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye echiche ya bụ ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ya mma.[4] Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nꞌihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.

MATIU 23:10-12
[10] Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nꞌihi na ọ bụ nanị otu onyendu ka unu nwere, onye bụ Onye nzọpụta ahụ.[11] “Onye dị ukwuu nꞌetiti unu kwesịrị ịbụ onye na-ejere unu ozi.[12] Ma onye ọ bụla mere onwe ya onwe ukwu ka a ga-eweda nꞌala. Ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.

JEMES 4:14-16
[14] Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.[15] Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị gaadị ndụ. Anyị ga-emekwa ihe dị otu a.”[16] Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi banyere ihe unu chọrọ ime. Ụdị ịnya isi a adịghị atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na ha dị njọ.

FILIPAI 2:5-8
[5] Ka omume unu nile dịrị ka nke Jisọs Kraịst.[6] Onye, ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke, ma ọ gụghị ike ya na ọdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.[7] Kama, o wedara onwe ya ala bịa nꞌụwa dị ka ohu, na onye na-adịghị ike. O kwenyere ka a mụọ ya dị ka e si mụọ mmadụ nile bi nꞌụwa.[8] Ebe ọ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, o wedakwara onwe ya ala, rube isi họrọ ịnwụ ọnwụ jọkarịsịrị njọ, ọnwụ ihere, nke ịbụ onye a kpọgidere nꞌelu obe.

Igbo Bible 1988
No Data