A A A A A

Ezigbo agwa: [Ile ọbịa]


HIBRU 3:2
Jisọs sitere nꞌaka Chineke nata nke a. Ọ rụkwara ọrụ ya dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihe nile e zitere ya ka o mee. Dị ka Jisọs, Mosisi bụkwa nwoke biri ndụ kwesịrị ntụkwasị obi.

1 TIMỌTI 5:10
Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.

TAITỌS 1:8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.

1 PITA 4:8-9
[8] Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.[9] Jirinụ obi ọma na-elerita ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọ bụla.

ỌLU OZI 16:33-34
[33] Nꞌoge ahụ, ọ sara ọnya ha, nꞌebe e tichara ha ihe, ma merụọ ha ahụ. Emesịa, e mere ya na ezinụlọ ya baptizim.[34] Ọ kpọbatara ha nꞌụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ha kweere na Chineke.

LUK 14:7-14
[7] Mgbe Jisọs hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri ahụ si họrọ nanị oche dị mkpa, oche dị mkpa, ọ gwara ha okwu a nꞌilu sị.[8] “Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị.[9] Nꞌihi na mgbe ndị e debeere oche ahụ dị mkpa bịara, onye kpọrọ gị oriri ga-abịakwute gị sị gị nye onyenwe oche ohere. Mgbe ahụ ị ga-ebili nꞌanya ihere gaa nọdụ nꞌoche dị ala.[10] “Kama mgbe ị batara, legharịa anya, nọdụ nꞌoche dị ala. Mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara hụ gị, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, bịa nọdụ nꞌoche a dị mkpa e debeere gị.’ Nꞌoge ahụ ị ga-enwe ugwu nꞌanya ndị ọzọ a kpọrọ oriri ahụ.[11] Onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”[12] Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha.[13] Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụkwụ rụrụ na ndị ngwụrọ na ndị ìsì.[14] Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.”

MATIU 25:34-46
[34] “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.[35] Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.[36] ***[37] “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?[38] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe?[39] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’[40] “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.[41] “Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.[42] Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.[43] Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.[44] “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’[45] “M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka.[46] “Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

ROM 12:13-20
[13] Ọ bụrụ na ụmụnna unu nꞌime Kraịst anọọ na mkpa, meenụ ka ha keta oke nꞌihe unu nwere. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa nke ọma.[14] Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.[15] Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soro ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nꞌakwa soro ha bee akwa.[16] Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile.[17] Bie ndụ ga-egosi ndị mmadụ na ị bụ onye Kraịst. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị.[18] Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.[19] Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”[20] Kama, ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie. Nye ya mmiri, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịṅụ mmiri. Nꞌịhi na ọ bụrụ na ị na-eme otu a, ọrụ ọma gị ga-eme ka ihere mee ya mgbe o chetara ihe ọjọọ o mere gị.

Igbo Bible 1988
No Data