A A A A A

Ezigbo agwa: [Okwukwe]


MATIU 21:22
Ihe ọ bụla kwa unu sitere nꞌokwukwe rịọọ Chineke nꞌekpere, unu ga-anatakwa ya.”

ROM 10:17
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nꞌige ntị nꞌozi ọma a ka mmadụ ji ekwere. Ozi ọma bụkwanụ ikwusa Jisọs Kraịst.

HIBRU 11:1-6
[1] Gịnị bụ okwukwe? Okwukwe bụ inwe ntụkwasị obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-amezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya.[2] Ọ bụ site nꞌokwukwe ha ka ndị mbụ kweere na Chineke ji nwee nnwapụta ọma ya.[3] Ọ bụ site nꞌokwukwe ka anyị ji mara na e mere ụwa na ihe nile anyị na-ahụ anya site nꞌokwu Chineke. Nꞌihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nꞌihe anyị na-adịghị ahụ anya.[4] Ebel bụ nwoke nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ọ chụrụ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke nwanne ya Ken chụrụ. Site nꞌokwukwe o nwere nnwapụta Chineke na ọ bụ onye ezi omume. Chineke nabatara Ebel nꞌihi na o nyere onyinye ya site nꞌokwukwe. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na Ebel anwụọlarị, anyị nwere ike ịmụta ihe site na ndụ ya banyere inwe okwukwe nꞌime Chineke.[5] Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ.[6] Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nꞌihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị inwe okwukwe na Chineke dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọ bụla na-achọ ya.

MAK 11:22-24
[22] Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị,[23] ‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.[24] “Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.

JEMES 2:19
Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji.

EFESỌS 2:8-9
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.

LUK 1:37
O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.”

2 KỌRINT 5:7
Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha.

EFESỌS 2:8
Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke!

1 KỌRINT 2:5
Ejighị m okwu na-ezipụta oke mmụta m gwa unu okwu, nꞌihi na achọghị m ka okwukwe unu dabere na mmụta mmadụ, kama ọ bụ ọchịchọ m ka okwukwe unu guzosie ike nꞌime Chineke.

JEMES 1:5-8
[5] Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.[6] Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.[7] Onye dị otu ahụ ekwesịghị ile anya na ọ ga-esite nꞌaka Chineke nata ihe ọ bụla.[8] Nꞌihi na onye ahụ dịkwa ka nwoke na-enwe obi abụọ mgbe nile, nke na-adịghị enwe mkpebi nꞌime onwe ya banyere ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

JEMES 1:5-8
[5] Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.[6] Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.[7] Onye dị otu ahụ ekwesịghị ile anya na ọ ga-esite nꞌaka Chineke nata ihe ọ bụla.[8] Nꞌihi na onye ahụ dịkwa ka nwoke na-enwe obi abụọ mgbe nile, nke na-adịghị enwe mkpebi nꞌime onwe ya banyere ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.

FILIPAI 4:13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.

JEMES 2:24
O weela anya ugbu a na ọ bụghị nanị na mmadụ kweere na Chineke ka e ji agụ ya nꞌonye ezi omume, kama ọ bụkwa nꞌihi na ndụ onye ahụ na omume ya, na-egosi na ọ na-erubere Chineke isi.

LUK 17:5
Ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ Jisọs otu ụbọchị sị ya, “Nyere anyị aka ka anyị nwee okwukwe karịa nke anyị nwere.”

Igbo Bible 1988
No Data