A A A A A

Ezigbo agwa: [Dọ aka ná ntị]


2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.

EFESỌS 6:4
Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.

NKPUGHE 3:19
Onye ọ bụla m hụrụ nꞌanya ka m na-ezi ihe site nꞌịta ya ahụhụ. Nꞌihi nke a, aghaghị m ịta gị ahụhụ pụrụ iche ma ọ bụrụ na i chegharịghị site nꞌọrụ ọjọọ gị na enweghị nghọta dị nꞌime gị bụrụ onye nwere ịnụ ọkụ nꞌobi nꞌihe Chineke.

TAITỌS 1:8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.

HIBRU 12:10-11
[10] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya.[11] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.

1 KỌRINT 9:25-27
[25] Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.[26] Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.[27] Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

2 KỌRINT 7:9-11
[9] Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nꞌihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nꞌihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nꞌihi akwụkwọ anyị deere unu.[10] Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.[11] Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile.

HIBRU 12:5-9
[5] Unu echefuola ihe akwụwkọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka Chineke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ sị: “Nwa m ewela iwe mgbe Chineke na-apịa gị ụtarị. Adala mba mgbe ọ na-egosi gị ụzọ i siri mejọọ.[6] Nꞌihi na onye Chineke hụrụ nꞌanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”[7] Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.[8] Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba.[9] Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.

EFESỌS 6:1-9
[1] Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nꞌihi na nke a bụ ọrụ unu dị ka ndị nke Kraịst. Ọ bụkwa ihe ziri ezi ka unu mee.[2] “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.[3] Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.”[4] Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.[5] Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.[6] Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.[7] Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya.[8] Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.[9] Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.

Igbo Bible 1988
No Data