A A A A A

Ezigbo agwa: [Ọmịiko]


KỌLỌSI 3:12
Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.

JEMES 5:11
Anyị na-agụ ha ugbu a dị ka ndị a gọziri agọzi nꞌihi na ha diri ahụhụ. Unu anụla akụkọ Job, otu o siri hụọ ahụhụ na otu Chineke siri gọzie ya nꞌikpeazụ. Chineke bụ onye jupụtara nꞌobi ebere na ọmiko.

ROM 9:15
Nꞌihi na Chineke gwara Mosisi sị, “Nanị onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ inwe ọmiko nꞌahụ ya ka m gaenwe ọmiko.”

2 KỌRINT 1:3-4
[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.[4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.

FILIPAI 2:1-3
[1] Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere,[2] meenụ ka m ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, site nꞌibi obi nke ịhụrịta onwe unu nꞌanya, site nꞌinwe nkwekọta nꞌihe ọ bụla, sitekwa nꞌiji otu obi, otu nzube, na otu mmụọ na-arụkọta ọrụ unu.[3] Echela echiche nanị banyere ọdịmma nke gị, ebila ndụ nꞌụzọ ịdọtara onwe gị otuto ndị ọzọ. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye echiche ya bụ ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ya mma.

MATIU 9:35-38
[35] Jisọs jegharịrị nꞌobodo nile dị nꞌebe ahụ, ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche ndị mmadụ na-arịa.[36] Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ nile na-abịakwute ya, o nwere ọmiko nꞌahụ ha, nꞌihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.[37] Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Lee na mkpụrụ obi a ga-eritere Chineke nꞌuru dị ukwuu. Ma ndị ga-ezisa ozi ọma bụ nanị mmadụ ole na ole.[38] Ya mere, kpeerenụ Chineke ekpere ka o zite ndị ọrụ ga-abịa nꞌubi a irite mkpụrụ obi ndị mmadụ nꞌuru.”

MATIU 20:29-34
[29] Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụsịrị Jeriko, igwe mmadụ sooro ya nꞌazụ.[30] Ndị ìsì abụọ nọ nꞌakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nꞌoke olu na-asi, “Onyenwe anyị, Nwa Devidi, biko meere anyị ebere!”[31] Igwe mmadụ ahụ so Jisọs gbọchiri ha ọnụ, sị ha mechie ọnụ ha. Ma ndị ìsì ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, meere anyị ebere!”[32] Mgbe Jisọs bịaruru nꞌebe ha nọ, o guzoro nꞌụzọ kpọọ ha, jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”[33] Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”[34] Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ha. O metụrụ ha aka nꞌanya. Ngwangwa ha malitere ịhụ ụzọ, bidokwa iso Jisọs.

MATIU 14:13-21
[13] Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma igwe mmadụ ndị si obodo dị iche iche nụrụ ya soro ya, kama ha si ụzọ elu ala jeruo ebe ọ nọ.[14] Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri ahụ wụda, ọ hụrụ igwe mmadụ ndị a ka ha nọ na-eche ha.[15] Nꞌoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji, ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nꞌọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nꞌime obodo zụọra onwe ha nri.”[16] Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.”[17] Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”[18] Jisọs sịrị ha, “Wetara m ha.”[19] Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nꞌahịhịa. O weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu, rịọ Chineke ka ọ gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ.[20] Onye ọ bụla rijuru afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe beredi dara nꞌala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.[21] Ọ bụkwa puku dimkpa ise ka Jisọs nyere nri nꞌụbọchị ahụ. A gụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụaka nile, ndị soro rie nri a.

MATIU 15:29-39
[29] Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nꞌelu ugwu nꞌọdụ ala.[30] Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ọrịa, na ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Jisọs gwọkwara ha nile.[31] Ọ tụrụ mmadụ nile nꞌanya mgbe ha hụrụ na ndị ogbi nile bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ. O jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izirel.[32] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a ebere, nꞌihi na mụ na ha anọọla abalị atọ nꞌebe a, ma ha eribeghị nri ọ bụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nꞌihi na ụfọdụ ha nwere ike ịda nꞌụzọ.”[33] Ndị na-eso ụzọ ya sịị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?”[34] Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nri unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe beredi asaa na azụ ole na ole.”[35] Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.[36] O weere beredi asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.[37] Onye ọ bụla nꞌime ha rijuru afọ. Ha dị puku dimkpa anọ riri nri ahụ. Ma a gụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.[38] Mgbe ha risịrị nri, a tụtụkọtara ibiribe nri dara nꞌala. Ha juru nkata asaa.[39] Jisọs zilagara ha, baa nꞌụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nꞌobodo Magadan.

MATIU 6:30-44
[30] Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta?[31] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?[32] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.[33] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.[34] “Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi.[35] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.[36] Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.[37] Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya?[38] Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ?[39] Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.[40] “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ.[41] “Rịọọ, ị ga-arịọta, chọọ, ị ga-achọta. Kụọọ aka, a ga-emeghere gị ụzọ.[42] Onye ọ bụla na-arịọ na-arịọta. Onye na-achọ na-achọtakwa. Onye na-akụ aka ka a ga-emeghere ụzọ.[43] Ọ bụrụ na nwantakịrị arịọọ nna ya beredi, ọ ga-enye ya nkume?[44] Ọ bụrụkwa na ọ rịọọ ya azụ, ọ ga-enye ya agwọ?

LUK 15:11-32
[11] Mgbe ahụ Jisọs kọkwaara ha akụkọ ọzọ sị ha, “E nwere otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.[12] Nwa ya nwoke nke nta bịakwutere nna ya otu ụbọchị sị ya, ‘Nna m, kenye m ugbu a, site nꞌakụ na ụba i nwere, ihe m kwesịrị iketa mgbe i nwụrụ.’ Nna ya kenyere nwa ya ahụ ihe o kwesịrị iketa.[13] “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorọbịa ahụ kwakọtara ihe nile o nwere hapụ ezi nna ya gaa biri nꞌotu obodo dị nnọọ anya. Nꞌebe ahụ, o mefuchara ego nile o nwere na ndụ ọjọọ.[14] Mgbe ọ zụfuchara ego nile o nwere, ụnwụ bidoro nꞌobodo ahụ, nke mere ka nwokorọbịa ahụ bido ịnọ agụụ.[15] Nꞌihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ, onye nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri.[16] Ma agụụ gụrụ nwokorọbịa a nke ukwuu, mee ya ka ọ chọọ iri site na nri ọ na-enye ezi, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ ka o rie.[17] “Otu ụbọchị, mgbe ọ nọdụrụ chee echiche banyere ọnọdụ ya, ọ jụrụ onwe ya ajụjụ sị, ‘Nꞌihi gịnị ka m ga-eji nwụọ nꞌagụụ nꞌebe a mgbe nna m nwere ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi, ndị nwere nri na-ezuru ha mapụtakwa?’[18] O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’[19] ***[20] “Mgbe nwokorọbịa a nwere mkpebi a nꞌime onwe ya, ọ hapụrụ obodo ahụ ịlaghachikwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmiko nꞌahụ ya. O si nꞌụlọ ya gbapụta, gaa zute ya, bakụọ ya, kelee ya.[21] “Mgbe ahụ nwokorọbịa ahụ gwara nna ya sị, ‘Nna m, emehiela m megide gị. Emehiekwala m megide Chineke. Ekwesịghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’[22] “Ma nna ya gwara otu onye na-ejere ya ozi sị, ‘Mee ngwangwa weta uwe kachasị mma dị nꞌụlọ bịa yikwasị nwa m uwe ahụ. Gbanyekwa ya ọla nꞌaka, nyekwa ya akpụkpọ ụkwụ ka o yiri,[23] gaakwa kpụpụta otu ehi gbara abụba gbuo ya ka anyị na ndị enyị anyị soro rie.[24] Nꞌihi na nwa m a, ka m gụrụ dị ka onye furu efu. Ma ugbu a a chọtala ya.’ Emesịa, ha bidoro iri na ịṅụ na ịṅụrị ọṅụ.[25] “Ọ dịghị anya ọkpara nwoke a, onye jere ịrụ ọrụ nꞌubi bidoro ịlọta nꞌụlọ. Mgbe ọ na-abịa nso ọ nụrụ ụda egwu, nụkwa ụda aṅụrị na ite egwu.[26] Ọ kpọrọ otu nꞌime ndị na-eje ozi jụọ ya sị, ‘Gịnị mere egwu ji na-ada, ndị mmadụ na-etekwa egwu?’[27] “Odibo ahụ zara ya sị, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna unu gburu ehi gbara abụba nꞌihi na ọ lọtara nꞌudo.’[28] “Mgbe ọkpara nwoke ahụ nụrụ okwu a, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ịbata nꞌụlọ ahụ. Mgbe nna ya matara ihe mere, ọ pụtara nꞌezi rịọ ya ka ọ bata.[29] Ma ọ gwara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ nile ndị a m nọrọ na-ejere gị ozi, enupụghị m isi nꞌụzọ ọ bụla. Ma o nweghị oge i ji nye m ọ bụladị ewu ntakịrị sị mụ na ndị enyị m jiri ya mere oriri.[30] Ma ugbu a, nwa gị a alọtala. Onye mefusiri ego nile i nwere nꞌebe ụmụ akwụla nọ. Ọ bụ ya ka i gbuuru ehi gbara abụba!’[31] “Mgbe ahụ nna ya zara ọkpara ya sị, ‘Nwa m, ọ bụ mụ na gị nọ kemgbe, ị makwaara na ihe nile m nwere bụ nke gị.[32] Anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ, kpọọ oriri, nꞌihi na onye a bụ nwanne afọ gị, onye anyị gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ, ma ugbu a ọ dịkwala ndụ. Ọ bụkwa onye furu efu a chọtara.’ ”

Igbo Bible 1988
No Data