A A A A A

Ezigbo agwa: [Nnabata]


1 KỌRINT 5:11-13
[11] Kama ndị m bu nꞌuche dee ihe ahụ bụ ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ma ha nọgidere na-akwa iko, ma ọ bụ na-enwe anya ukwu, ma ọ bụ na-efe arụsị. Ee, ndị ahụ sị na ha bụ ndị Kraịst ma nọgidekwa na-ekwutọ ibe ha, na-aṅụbiga mmanya oke, ma na-ezukwa ohi. Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ ọ bụla. Unu esola ha rikọọ ihe.[12] Ọ bụghị ọrụ anyị ikpe ndị na-esoghị anyị bụrụ ndị Kraịst ikpe. Ma ọ bụ ọrụ anyị ikpe ndị nọ nꞌọgbakọ anyị na-eme mmehie ikpe.[13] Ọ bụ nanị Chineke ka ọ dịrị ikpe ndị na-abụghị ndị Kraịst ikpe. Ya mere, sitenụ nꞌetiti unu wepụ nwoke a.

1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

1 PITA 3:8-9
[8] Ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu bụ nke a, nweenụ otu obi, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu. Bụrụnụ ndị nwere obi ọma na obi dị umeala.[9] Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

ROM 2:11
Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu.

ROM 5:8
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.

ROM 8:31
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ọma ndị a nile Chineke meere anyị. Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye pụrụ iguzo megide anyị?

ROM 14:1-2
[1] Nabatanụ ụmụnna ndị akọnuche ha na-esogbu ma ha soro ndị ọzọ okwukwe ha siri ike mee ihe ha na-eme. Unu ekwujọla ha, nꞌihi na ụzọ ha si ele ihe anya abụghị ụzọ unu si ele ya.[2] Nꞌihi na, dị ka ịma atụ, ọ dị ndị okwukwe ha siri ike, ndị kweere na ha nwere ike iri anụ ọ bụla. Ọ dịkwa ndị ọzọ okwukwe ha na-esighị ike ndị na-eri nanị ahihia nri.

HIBRU 10:24-25
[24] Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu.[25] Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso.

JỌN 6:35-37
[35] Jisọs zaghachiri ha sị, “Abụ m nri na-enye ndụ. Onye ọ bụla na-abịakwute m agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ndị nile kweere na m nkụ.[36] Dị ka m gwara unu, unu ahụla m ma unu ekweghị.[37] Ma ụfọdụ ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa ndị nile Nna m nyere m ma ha bịakwute m.

KỌLỌSI 3:12-14
[12] Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.[13] Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.[14] Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu.

MATIU 5:38-42
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.[40] Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị.[41] Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị.[42] Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.

MATIU 25:34-40
[34] “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.[35] Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.[36] ***[37] “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?[38] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe?[39] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’[40] “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.

ROM 15:1-7
[1] Ya mere, ka anyị nile ndị okwukwe ha siri ike hapụ ichefu na anyị ka ọ dịrị inyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka. Anyị ekwesịghị ime nanị ihe na-atọ anyị ụtọ.[2] Ka onye ọ bụla nꞌime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ. Ka anyị na-eme ihe ga-enyere ha aka, na ihe ga-ewuli okwukwe ha elu nꞌime Onyenwe anyị.[3] Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya emeghị ihe tọrọ onwe ya ụtọ, kama dị ka onye dere akwụkwọ Abụ ọma si gwa anyị, “Ọ bịara ka ịta ụta nile na mkparị nile nke ndị na-emegide Chineke dakwasị ya!”[4] Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi.[5] Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị.[6] Nꞌihi na nke a ga-eme ka unu nile jikọtaa obi unu, na olu unu nꞌotu, inye Chineke nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.[7] Ya mere, ọ bụ ihe dị mma na unu ga na-akpọbata onwe unu dị ka Kraịst si kpọbata unu. Nke a ga-ewetara Chineke otuto.

ROM 14:10-19
[10] Ya mere, o kwesịghị ka i kwujọọ nwanna gị. O kwesikwaghị ka i leda ya anya. Nꞌihi na anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Chineke nꞌụbọchị ahụ ọ ga-ekpe ụwa ikpe.[11] Nꞌihi na Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ebe m na-adị ndụ, mmadụ nile nꞌotu nꞌotu aghaghị igbu ikpere nꞌala nye m. Mmadụ nile ga-ekwupụtakwa mmehie ha nꞌihu m.”[12] Ee, anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nꞌihu Chineke.[13] Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.[14] Ma nꞌụche m, ana m ekwukwa ya nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya na nri ọ bụla adịghị nke mmadụ na-ekwesịghị iri. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie na ụfọdụ nri adịghị mma oriri, nri dị otu a bụụrụ onye ahụ nri na-adịghị ọcha.[15] Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ.[16] A sịkwarị na ihe ị na-eme dị mma, emela ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kwujọọ gị.[17] Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.[18] Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị.[19] Ka ihe naagụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe gaeweta udo na ime ihe nꞌụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.

Igbo Bible 1988
No Data