A A A A A

Chineke: [Oge Chineke]


1 TIMỌTI 3:15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.

JỌN 6:54
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.

JỌN 8:32
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”

MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.

JỌN 12:48
Onye ọ bụla jụrụ m, jụkwa ozi m, nwere onye na-ekpe ya ikpe. Okwu nile m kwuru ka a ga-eji kpee ya ikpe.

JỌN 1:1
Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.

GALETIA 6:9
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.

GALETIA 1:19
Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.

2 PITA 3:8
Ndị m hụrụ nꞌanya, unu echefula otu okwu a, nꞌanya Chineke, ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti otu ụbọchị na puku ụbọchị. Ha bụ otu ihe nꞌanya ya.

ỌLU OZI 1:7
Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata ihe Nna m na-ezube ime, na mgbe ọ na-akwado ime ihe o zubere ime.

GALETIA 4:4
Ma mgbe oge a kara aka ruru, oge ahụ Chineke kpebiri, o zitere Ọkpara ya, ka nwanyị mụọ ya dị ka onye Juu.

EFESỌS 5:16
Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.

JỌN 3:3-5
[3] Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”[4] Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”[5] Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.

HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

EFESỌS 1:10
Nke a bụkwa ihe o zubere: Na mgbe oge ahụ ruru, ọ ga-akpọkọta ụmụ ya nile na ihe nile o kere nꞌeluigwe na nꞌụwa, ka Kraịst bụrụ isi ihe nile.

JỌN 16:13
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.

GALETIA 4:19
Ezi ụmụ m, lee ka omume unu si ewute mmụọ m. Lee ka m si nọdụkwa nꞌọnọdụ ihe mgbu, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka unu zuo oke nꞌime Kraịst, dị ka nwanyị nọ nꞌihe mgbu si eche ọmụmụ nwa ọhụrụ ya.

MATIU 16:18
Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.

MATIU 18:15-18
[15] “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.[16] Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.[17] Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.[18] Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.

EFESỌS 1:22-23
[22] Chineke emeela ka ihe nile dị nꞌokpuru ike Kraịst, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe nile nke nzukọ ya bụ chọọchị.[23] Nꞌihi na chọọchị bụ anụ ahụ Kraịst. Ọ bụkwa ihe na-emezu Kraịst onye ya onwe ya bụ mmezu ihe nile nꞌebe nile.

EFESỌS 5:23
Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.

ỌLU OZI 4:32
Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere.

1 KỌRINT 1:10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.

JỌN 14:6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

JỌN 14:6-28
[6] Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.[7] Ọ bụrụ na ị maara onye m bụ, ị ga-amatakwa Nna m. Site taa unu amatala ya. Unu ahụkwala ya.”[8] Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị ọ bụrụ na i zi anyị Nna ahụ afọ ga-eju anyị.”[9] Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’[10] Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya.[11] Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ.[12] “Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m.[13] Ihe ọ bụla unu gaarịọ site nꞌaha m, aga m enye unu ya. Aga m enye ya ka e site na ya nye Nna m otuto nꞌihi ihe Ọkpara ya na-eme.[14] Ihe ọ bụla unu rịọrọ nꞌaha m, aga m eme ya.[15] “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu.[16] Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu.[17] Ndị bi nꞌụwa agaghị anabata ya, nꞌihi na ha apụghị ịhụ ya anya. Ha amakwaghị ya. Ma unu onwe unu maara ya, nꞌihi na unu na ya nọ ugbu a. O bikwa nꞌime unu.[18] Agaghị m ahapụ unu ka unu nọdụ nanị unu. Aga m abịakwutekwa unu.[19] Na mgbe na-adịghị anya site ugbu a, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu onwe unu ga-ahụ m anya. Nꞌihi na m na-adị ndụ unu onwe unu gaadịkwa ndu.[20] Mgbe ụbọchị ahụ bịara, ihe nile ga-edo unu anya. Unu ga-amata na m nọ nꞌime Nna m na unu nọkwa nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime unu.[21] Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.”[22] Judas (ọ bụghị nke raara ya nye) sịrị ya, “Onyenwe ayị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”[23] Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m nꞌanya, ọ ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nꞌanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nꞌebe onye ahụ nọ soro ya biri.[24] Onye na-ahụghị m nꞌanya agaghị edebe okwu m. Okwu nile unu nụrụ nꞌọnụ m abụghị nke m. Ha bụ okwu Nna m, onye zitere m.[25] Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu nọ.[26] Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu.[27] “Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.[28] Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.

Igbo Bible 1988
No Data